Abụ Ọma 15:1-5
Abụ Devid.
15 Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?
Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?+
2 Ọ bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,*+Onye na-eme ezi ihe,+Onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.+
3 Ọ naghị ekwutọ* mmadụ.+
Ọ naghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ,+Ọ naghịkwa ekwujọ ndị enyi ya.*+
4 Ọ naghị anabata onye ọ bụla na-abaghị uru,+Ma ọ na-akwanyere ndị na-atụ egwu Jehova ùgwù.
Ọ na-emezu nkwa o kwere,* ọ bụrụgodị na imezu ya ga-akpa ya aka ọjọọ.+
5 Ọ naghị ana ọmụrụ nwa ma ọ gbazinye mmadụ ego,+Ọ naghịkwa ana aka azụ* ka e megbuo onye aka ya dị ọcha.+
A gaghị eme ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị a daa.*+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “na-akwụwa aka ọtọ.”
^ Na Hibru, “eji ire ya ekwutọ.”
^ Ma ọ bụ “emenye ndị enyi ya ihere.”
^ Na Hibru, “ihe ọ ṅụrụ n’iyi.”
^ Ma ọ bụ “eri ngarị.”
^ Ma ọ bụ “zọhie ụkwụ.”