Abụ Ọma 16:1-11
Miktam* Devid.
16 Chineke, biko chebe m, n’ihi na ọ bụ gị ka m ji mere ebe mgbaba.+
2 M sịrị Jehova: “Ị bụ Jehova. Ihe ọma niile na-emere m* si n’aka gị.
3 Ndị nsọ ndị nọ n’ụwa,Bụ́ ndị dị ebube, na-eme ka obi dị m ezigbo ụtọ.”+
4 Ndị ji obi ha niile na-efe chi ọzọ na-akpatara onwe ha ọtụtụ nsogbu.+
E nweghị mgbe m ga-eso ha chụọ àjà mmanya ha nke ha na-eji ọbara achụ,Agaghịkwa m e ji ọnụ m* akpọ aha ha.+
5 Jehova, ị bụ òkè e kenyere m,+ bụrụkwa iko m.+
Ị naghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ihe m ketara.
6 Ebe e kenyere m mara mma.
N’eziokwu, ihe m ketara dị m mma.+
7 M ga-eto Jehova, onye dụrụ m ọdụ.+
N’abalị, ihe m na-eche n’ime ime obi m na-akụziri m ihe.*+
8 M mere ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.+
Ebe ọ bụ na ọ nọ m n’aka nri, e nweghị ihe ga-eme ka m daa.*+
9 N’ihi ya, obi na-atọ m ụtọ. Ana m enwe* ezigbo aṅụrị.
Ahụ́ rukwara m ala.
10 N’ihi na ị gaghị ahapụ m* n’ili.*+
Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike nọrọ n’ili.*+
11 Ị na-eme ka m mara ụzọ ndụ.+
Onye nọ n’ihu gị na-enwe ọṅụ na-enweghị atụ.+
Onye nọ n’aka nri gị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Àgwà ọma m.”
^ Ma ọ bụ “egbugbere ọnụ.”
^ Na Hibru, “N’abalị, akụrụ m na-agbazi m.”
^ Ma ọ bụ “ka m maa jijiji.”
^ Na Hibru, “Ebube m na-enwe.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “hụ olulu.” O nwere ike ịbụ, “ree ure.”