Abụ Ọma 17:1-15

  • Ekpere Devid kpere ka e chebe ya

    • “I nyochaala obi m” (3)

    • “Zoo m n’okpuru nku gị” (8)

Ekpere Devid. 17  Jehova, biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ ka e kpee m ikpe ziri ezi. Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebe ka i nyere m aka. Gee ntị n’ekpere m, nke m na-ejighị aghụghọ ekpe.+   Biko, kpebie ihe ziri ezi nke ga-abara m uru.+ Biko, ka anya gị hụ ihe ziri ezi.   I nyochaala obi m. I leruola m anya n’abalị.+ Ị nụchaala m.+ Ị ga-achọpụta na e nweghị nkata ọjọọ m kpara,Ejighịkwa m ọnụ m kwuo ihe ọjọọ.   N’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-eme,Okwu gị na-enyere m aka ka m ghara iso ndị na-ezu ohi.+   Nyere m aka ka m na-aga n’ụzọ gị,Ka m* ghara ịda.+   Chineke, m na-akpọ gị ka i nyere m aka maka na ị ga-aza m.+ Gee m ntị.* Nụrụ ihe m na-ekwu.+   Gị Onye na-azọpụta ndị na-agbaba n’aka gị siri ike,*Onye na-azọpụta ha n’aka ndị na-enupụrụ gị isi,Biko, mee ihe dị ebube iji gosi ịhụnanya gị.+   Chebe m ka mkpụrụ anya gị.+ Zoo m n’okpuru nku gị.+   Napụta m n’aka ndị ajọ omume ndị na-alụso m ọgụ,N’aka ndị iro m gbara m gburugburu ma na-achọ igbu m.+ 10  Ihe anaghịzi emetụ ha n’ahụ́.* Ha na-etu ọnụ. 11  Ugbu a, ha agbaala anyị gburugburu.+ Ha na-ele anyị anya ka ha chọta ohere ha ga-eji eme ka anyị daa. 12  Onye ajọ omume dị ka ọdụm chọrọ ịdọri anụ,Ka ọdụm makpu n’ebe zoro ezo. 13  Jehova, biko, bilie lụso ya ọgụ+ ma merie ya. Jiri mma agha gị napụta m* n’aka onye ajọ omume. 14  Jehova, biko, jiri aka gị napụta mN’aka ndị nọ n’ụwa a,* ndị ihe ha ketara bụ ndụ ha dị ugbu a,+Ndị i ji ihe ọma ndị ị na-enye ndị mmadụ eme ka afọ ju,+Ndị na-ahapụrụ ọtụtụ ụmụ ha mụrụ akụ̀ ha ga-eketa. 15  Ma ezi omume m na-eme ga-eme ka m hụ ihu gị. Obi na-atọ m ụtọ ma m teta hụ na ị nọnyeere m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụkwụ m.”
Ma ọ bụ “Hulata gee ntị.”
Na Hibru, “n’aka nri gị.”
Ma ọ bụ “Abụba ha ekpuchiela ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị oge a.”