Abụ Ọma 26:1-12

  • Irubere Chineke isi

    • “Jehova, biko, nyochaa m” (2)

    • Mụ na ndị ọjọọ anaghị akpa (4, 5)

    • ‘M ga-aga ebe ịchụàjà Chineke gburugburu’ (6)

Abụ Devid. 26  Jehova, biko, kpee m ikpe, n’ihi na m na-erubere gị isi.+ Ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi. Enweghị m obi abụọ ọ bụla.+   Jehova, biko, nyochaa m, nwaleekwa m. Nụchaa obi m na ihe m na-eche n’ala ala obi m.*+   N’ihi na m na-echeta ịhụnanya gị mgbe niile,M na-ejekwa ije n’ezigbo ụzọ gị.+   Mụ na ndị aghụghọ anaghị akpa.*+ Mụ na ndị na-ezochi ụdị ndị ha bụ* anaghịkwa anọ.   M kpọrọ òtù ndị na-eme ihe ọjọọ asị,+Anaghịkwa m ekwe ka mụ na ndị ọjọọ na-akpa.*+   M ga-akwọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha. Jehova, m ga-aga ebe ịchụàjà gị gburugburu,   Iji kelee gị n’olu dara ụda+Ma kọsaa ọrụ niile dị ebube ị na-arụ.   Jehova, eji m ụlọ gị, bụ́ ebe i bi, kpọrọ ihe,+Bụ́ ebe ebube gị dị.+   Egbukọtala mụ* na ndị mmehie,+Egbukọtakwala mụ na ndị tigbuo zọgbuo,* 10  Ndị na-eme omume na-eme ihere,Ndị na-anara aka azụ.* 11  Ma, m ga na-erubere gị isi. Napụta m ma meere m amara. 12  M guzo n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*+ M ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu too Jehova.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “akụrụ m.”
Na Hibru, “anọ.”
Ma ọ bụ “ndị ihu abụọ.”
Na Hibru, “na-anọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ndị na-awụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “Ndị na-enye ndị ọzọ aka azụ.”
Na Hibru, “Ụkwụ m guzo n’ala dị larịị.”