Abụ Ọma 34:1-22
Abụ Devid dere gbasara oge o mere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu Abimelek, ya achụpụ Devid, Devid alawa.
א [Alef]
34 M ga na-eto Jehova mgbe niile.
Agaghị m akwụsị iji ọnụ m na-eto ya.
ב [Bet]
2 M* ga-eji Jehova nyaa isi.+
Ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya ma ṅụrịa ọṅụ.
ג [Gimel]
3 Soronụ m jaa Jehova mma.+
Ka anyị niile too aha ya.
ד [Dalet]
4 Ajụrụ m Jehova ase, ya aza m.+
Ọ napụtara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.+
ה [Hee]
5 Ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ na-enwe obi ụtọ.
A gaghị emechu ha ihu.
ז [Zayin]
6 Onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya kpọkuru Jehova, ya anụ ya.
Ọ zọpụtara ya n’ahụhụ niile ọ na-ata.+
ח [Het]
7 Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị na-atụ egwu ya,+Ọ na-anapụtakwa ha.+
ט [Tet]
8 Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.+
Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ.
י [Yod]
9 Unu niile bụ́ ndị nsọ Jehova, tụọnụ egwu ya,N’ihi na e nweghị ihe na-akọ ndị na-atụ egwu ya.+
כ [Kaf]
10 Agụụ nwedịrị ike ịgụ ọdụm ndị siri ike,Ma ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.+
ל [Lamed]
11 Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị.
M ga-akụziri unu ihe bụ́ ịtụ egwu Jehova.+
מ [Mem]
12 Ònye n’ime unu ka ndụ na-atọ ụtọ,Nke chọkwara ịdị ogologo ndụ ma na-enwe obi ụtọ?+
נ [Nun]
13 Ya ejila ọnụ* ya kwuo ihe ọjọọ+Ma ọ bụ jiri ya* na-aghọ aghụghọ.+
ס [Samek]
14 Ya hapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.+
Ya na-achọ udo ma gbalịa na-eme udo.+
ע [Ayin]
15 Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+Ntị ya na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.+
פ [Pee]
16 Ma Jehova na-ajụ ndị na-eme ihe ọjọọ,Ka e wee bibie ha, a gharazie icheta ha n’ụwa.+
צ [Sadee]
17 Ha bere ákwá, Jehova wee nụ ya.+
Ọ napụtara ha n’ahụhụ niile ha na-ata.+
ק [Kof]
18 Jehova nọ ndị obi gbawara nso.+
Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.*+
ר [Resh]
19 Ọtụtụ nsogbu* na-abịara onye ezi omume,+Ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.+
ש [Shin]
20 Ọ na-echebe ọkpụkpụ ya niile.
E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.+
ת [Tọọ]
21 Ọdachi ga-egbu onye ajọ omume.
A ga-ama ndị kpọrọ onye ezi omume asị ikpe.
22 Jehova na-agbapụta ndụ* ndị ohu ya.
E nweghị ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
^ Na Hibru, “egbugbere ọnụ ya.”
^ Na Hibru, “ire.”
^ Ma ọ bụ “ndị obi dara mbà.”
^ Ma ọ bụ “ọdachi.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”