Abụ Ọma 43:1-5

  • Chineke bụ Onyeikpe na-anapụta ndị ya

    • “Zite ìhè gị na eziokwu gị” (3)

    • “Gịnị mere m ji daa mbà?” (5)

    • “M ga-echere Chineke” (5)

43  Chineke, biko, kpee m ikpe.+ Kpechite ọnụ m n’ikpe+ mụ na mba na-anaghị erubere gị isi nwere. Napụta m n’aka onye aghụghọ nke na-eme ajọ omume.   N’ihi na ị bụ Chineke m, bụrụkwa ebe m a rụsiri ike.+ Gịnị mere i ji jụ m? Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị na-eru uju n’ihi otú ndị iro m si na-emegbu m?”+   Zite ìhè gị na eziokwu gị.+ Ka ha na-edu m.+ Ka ha duga m n’ugwu nsọ gị nakwa n’ụlọikwuu gị dị ebube.+   Mgbe ahụ, m ga-abịa n’ebe ịchụàjà Chineke,+Bịakwute Chineke, onye na-eme ka m na-enwe nnukwu aṅụrị. Chineke, bụ́ Chineke m, m ga-eji ụbọ akwara too gị.+   Gịnị mere m* ji daa mbà? Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike? M ga-echere Chineke,+N’ihi na m ka ga-eto ya ebe ọ bụ Onye Nzọpụta m kachanụ na Chineke m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”