Abụ Ọma 48:1-14

  • Zayọn bụ obodo Eze Ukwu

    • Ọ na-eme ka ụwa niile ṅụrịa ọṅụ (2)

    • Leruonụ obodo a na ụlọ elu ya anya (11-13)

Abụ ọma. Abụ ụmụ Kora.+ 48  Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto yaN’obodo Chineke anyị, n’ugwu nsọ ya.   Ugwu Zayọn nke dị n’ime ime ebe ugwu,Bụ́ obodo Eze Ukwu,+Mara mma n’ebe dị ezigbo elu ọ dị, bụrụkwa obodo na-eme ka ụwa niile ṅụrịa ọṅụ.+   N’ụlọ elu ndị a rụsiri ike dị na ya,Chineke emeela ka a mara na ya bụ ebe mmadụ na-agbaba, aka aghara ịkpa ya.+   Lee, ndị eze ezukọtala. Ha niile enurula bịa.   Mgbe ha hụrụ ya, o juru ha anya. Egwu tụrụ ha, ha wee gbalaga n’ihi ụjọ.   Ụjọ jidere ha n’ebe ahụ. Ha hụsiri anya ka nwaanyị na-amụ nwa.   I ji ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka ụgbọ mmiri Tashish kpuo.   Anyị nọ n’obodo Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’obodo Chineke anyị,Hụ ihe ndị anyị nụrụ n’akụkọ. Chineke ga-echebe obodo a ruo mgbe ebighị ebi.+ (Sila)   Chineke, anyị nọ n’ụlọ nsọ gịNa-echebara ịhụnanya gị echiche.+ 10  Chineke, otuto a na-eto gị na-eru n’ebe niile n’ụwaOtú aha gị si ede ude n’ebe niile n’ụwa.+ Ị na-eji ike* gị eme ihe ziri ezi.+ 11  Ka Ugwu Zayọn+ ṅụrịa ọṅụ,Ka obodo ndị dị na Juda nwee obi ụtọ n’ihi ikpe ị na-ekpe.+ 12  Gaanụ Zayọn gburugburu. Gazuonụ ya okirikiri. Gụọnụ ụlọ elu ndị dị na ya ọnụ.+ 13  Chebaranụ mgbidi ya ndị siri ike echiche.+ Leruonụ ụlọ elu ndị dị na ya a rụsiri ike anya,Ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ ndị na-abịa abịa. 14  N’ihi na Chineke a bụ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ ga-edu anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “aka nri.”
O nwere ike ịbụ, “ruo mgbe anyị nwụrụ.”