Abụ Ọma 73:1-28

  • Onye na-efe Chineke ghọtara ihe juburu ya anya

    • “Ọ fọrọ obere ka m kpafuo” (2)

    • “A na-enye m nsogbu kwa ụbọchị” (14)

    • ‘Ruo mgbe m batara n’ebe nsọ Chineke’ (17)

    • Ndị ajọ omume guzo n’ala na-amị amị (18)

    • Ịbịa Chineke nso dị m mma (28)

Abụ Esaf.+ 73  N’eziokwu, Chineke na-emere Izrel ihe ọma. Ọ na-emere ya ndị obi ha dị ọcha.+   Ma, ọ fọrọ obere ka m kpafuo. Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m mịchapụ.+   N’ihi na m malitere imere ndị ajọ omume, bụ́ ndị onwe ha na-ebu isi,* anyaụfụMgbe m hụrụ na ihe na-agaziri ha.+   N’ihi na ahụ́ na-adị ha mma.* Ha anaghị ahụsi anya mgbe ha na-anwụ.+   Ha anaghị enwe nsogbu otú ndị ọzọ na-enwe,+Ha anaghịkwa ata ahụhụ otú ndị ọzọ na-ata.+   N’ihi ya, mpako bụ ihe olu ha.+ Ha yi tigbuo zọgbuo ka uwe.   Akụ̀* ha na-eme ka anya ha zaa. Ihe na-agaziri ha karịa otú ha chere n’obi ha.   Ha na-achị ndị ọzọ ọchị, na-ekwukwa ihe ọjọọ.+ Ha na-etu ọnụ na ha ga-emesi ndị ọzọ ike.+   Ha na-ekwu okwu ka à ga-asị na isi ha na-eru n’eluigwe. Ha na-ejegharị n’ụwa, na-ekwu ihe ọ bụla masịrị ha. 10  N’ihi ya, ndị Chineke* na-agakwuru ha,Ha na-aṅụkwa mmiri ha nke juru ebe niile. 11  Ha na-asị: “Olee otú Chineke ga-esi mara?+ Onye Kacha Elu ọ̀ ma ihe na-eme?” 12  Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha anaghị enwe nsogbu ọ bụla.+ Ha na-eme ka akụ̀ ha na-adịkwu ọtụtụ.+ 13  N’eziokwu, mbọ m gbara mee ka obi m dị ọcha bụ n’efu. Ọ bụkwa n’efu ka m kwọrọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha.+ 14  A na-enye m nsogbu ụbọchị niile.+ A na-ata m ahụhụ kwa ụtụtụ.+ 15  Ma, a sị na m kwuru ihe ndị a,Ọ pụtara na mụ aghọgbuola ndị gị. 16  Mgbe m gbara mbọ ka m ghọta ya,Ọ nọ na-enye m nsogbu n’obi 17  Ruo mgbe m batara n’ebe nsọ dị ebube nke Chineke,M wee ghọta ihe ga-eme ha n’ọdịnihu. 18  N’eziokwu, ọ bụ n’ala na-amị amị ka i dowere ha.+ Ị na-eme ka ha daa laa n’iyi.+ 19  A na-ebibi ha na mberede.+ Ha na-ala n’iyi n’egbughị oge. 20  Jehova, ị ga-echefu ha mgbe i biliri,Otú mmadụ si echefu nrọ mgbe o tetara n’ụra. 21  Ma obi adịghị m mma,+Ime ahụ́* na-egbukwa m ezigbo mgbu, 22  Anaghị m eche echiche, amaghịkwa m ihe. M yiri anụ ọhịa na-amaghị ihe n’anya gị. 23  Ma ugbu a, mụ na gị na-anọ mgbe niile. I jidela m aka n’aka nri m.+ 24  I ji ndụmọdụ ị na-enye m na-edu m,+Ị ga-emekwara m amara n’ikpeazụ.+ 25  Ènwere m onye ọzọ n’eluigwe? Ebe ọ bụ na m nwere gị, e nweghị ihe ọzọ m chọrọ n’ụwa.+ 26  Ike nwere ike ịgwụ m, obi nwekwara ike ịda m mbà,Ma, Chineke bụ oké nkume m nke na-eme ka obi sie m ike, bụrụkwa òkè m ruo mgbe ebighị ebi.+ 27  N’eziokwu, a ga-ala ndị na-agbara gị ọsọ n’iyi. Ị ga-ebibi onye ọ bụla kpara àgwà ka akwụna wee hapụ gị.+ 28  Ma, ịbịa Chineke nso dị m mma.+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba m,Ka m wee kọsaa ọrụ ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị na-etu ọnụ.”
Ma ọ bụ “ha na-enwe afọ ukwu.”
Na Hibru, “Abụba.”
Na Hibru, “ndị ya.”
Na Hibru, “Akụrụ m.”