Abụ Ọma 87:1-7

  • Zayọn bụ obodo ezi Chineke

    • Ndị a mụrụ na Zayọn (4-6)

Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma. 87  Chineke tọrọ ntọala obodo ya n’ugwu dị nsọ.+   Jehova nwere mmasị na Zayọn*+Karịa n’ebe niile ọzọ n’Izrel.*   Gị obodo ezi Chineke,+ a na-ekwu ọtụtụ ihe dị ịtụnanya banyere gị. (Sila)   M ga-agụnye ndị bi na Rehab+ nakwa na Babịlọn ná ndị ma m. A ga-ekwu gbasara ndị Filistia, ndị Taya ma ọ bụ ndị Kush,Sị: “A mụrụ onye a n’ebe ahụ.”   A ga-ekwukwa banyere Zayọn, sị: “A mụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha na ya.” Onye Kacha Elu ga-emekwa ka Zayọn kwụsie ike.   Mgbe Jehova ga na-edeba aha ndị dị iche iche n’akwụkwọ, ọ ga-ekwu, sị: “A mụrụ onye a n’ebe ahụ.” (Sila)   Ndị na-agụ egwú+ nakwa ndị na-agba egwú a na-agba gburugburu gburugburu+ ga-asị: “Ihe ọma niile na-abịara anyị si n’aka gị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ọnụ ụzọ ámá Zayọn.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu niile nke Jekọb.”