Abụ Ọma 91:1-16
91 Onye ọ bụla nke bi n’ebe zoro ezo nke Onye Kacha Elu+Ga-anọ na ndò nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+
2 M ga-asị Jehova: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m a rụsiri ike.+
Ị bụ Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.”+
3 N’ihi na Chineke ga-anapụta gị n’ọnyà nke onye na-achụ nta nnụnụ siri,Napụtakwa gị n’ajọ ọrịa na-efe efe.
4 Ọ ga-eji nku ya kpuchie* gị,Nku ya ga-abụkwara gị ebe mgbaba.+
Eziokwu ya+ ga na-echebe gị otú nnukwu ọta+ na mgbidi siri ike si echebe mmadụ.
5 Ị gaghị atụ ihe ọ bụla egwu n’abalị,+Ị gaghịkwa atụ akụ́ a gbapụrụ n’ehihie egwu,+
6 Ị gaghịkwa atụ egwu ọrịa nke na-efe ndị mmadụ n’abalịMa ọ bụ ihe na-egbu ndị mmadụ n’etiti ehihie.
7 Otu puku mmadụ ga-ada n’akụkụ gị,Puku mmadụ iri ga-adakwa n’aka nri gị,Ma ihe ọjọọ ndị a agaghị eme gị.+
8 Ọ bụ naanị anya ka ị ga na-eleMgbe ị ga-ahụ ka a na-ata ndị ajọ omume ahụhụ.*
9 Ebe ọ bụ na ị sịrị: “Jehova bụ ebe mgbaba m.”
I jirila Onye Kacha Elu mere ebe gị a rụsiri ike;*+
10 E nweghị ọdachi ga-adakwasị gị,+E nweghịkwa ihe ọjọọ ga-abịa nso n’ụlọikwuu gị.
11 N’ihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya+ iwu banyere gị,Ka ha na-eche gị nche n’ebe ọ bụla ị na-aga.+
12 Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị,+Ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.+
13 Ị ga-azọ ọdụm na agwọ ubí ụkwụ.
Ị ga-azọpịa nnukwu ọdụm na nnukwu agwọ.+
14 Chineke sịrị: “Ebe ọ bụ na ọ hụrụ m n’anya, m ga-anapụta ya.+
M ga-echebe ya maka na ọ ma aha m.+
15 Ọ ga-akpọ m, m ga-azakwa ya.+
M ga-anọnyere ya n’oge ọ na-ata ahụhụ.+
M ga-anapụta ya ma mee ka ọ dị ebube.
16 M ga-eme ka ọ dị ogologo ndụ,+M ga-emekwa ka ọ hụ otú m ga-esi azọpụta ya.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “chebe.”
^ Na Hibru, “ụgwọ a na-akwụ ndị ajọ omume.”
^ Ma ọ bụ “ebe mgbaba.”