Abụ Ọma 97:1-12
97 Jehova abụrụla Eze.+
Ka ụwa ṅụrịa ọṅụ.+
Ka agwaetiti niile ṅụrịa ọṅụ.+
2 Ígwé ojii na oké ọchịchịrị gbara ya gburugburu.+
O ji ezi omume na ikpe ziri ezi tọọ ntọala ocheeze ya.+
3 Ọkụ na-esi n’ihu ya apụta,+Ọ na-erepịakwa ndị iro ya niile gbara ya gburugburu.+
4 Àmụ̀mà ya na-eme ka ìhè nwuo n’ụwa.
Ụwa na-ahụ ya wee maa jijiji.+
5 Ugwu niile na-agbaze ka mgbá aṅụ* n’ihi Jehova,+N’ihi Onyenwe ụwa niile.
6 Eluigwe na-akọsa ezi omume ya,Mmadụ niile na-ahụkwa ebube ya.+
7 Ka e menye ndị niile na-efe arụsị a pịrị apị ihere,+Ndị ji chi ha na-abaghị uru anya isi.+
Chi niile, kpọọrọnụ Chineke isiala.*+
8 Jehova, Zayọn na-anụ ihe i kpebiri wee ṅụrịa ọṅụ.+
Obodo ndị dị na Juda na-enwe obi ụtọN’ihi ihe i kpebiri.+
9 N’ihi na Jehova, ọ bụ gị bụ Onye Kacha Elu n’ụwa niile.
Ị dị ezigbo elu karịa chi niile ọzọ.+
10 Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.+
Ọ na-eche ndị* na-erubere ya isi nche.+
Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.+
11 Ìhè enwuorola ndị ezi omume,+Ndị obi ha dị ọcha na-aṅụrịkwa ọṅụ.
12 Unu ndị ezi omume, ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi Jehova,Tookwanụ aha nsọ ya.*
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
^ Ma ọ bụ “feenụ ya.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”
^ Na Hibru, “ihe dị nsọ e ji echeta ya.”