Abụ Solomọn 3:1-11
3 “M dina n’elu àkwà* m n’abalịNa-eche banyere onye m hụrụ n’anya.+
M tụrụ anya ya, ma ahụghị m ya.+
2 M ga-ebili gagharịa n’obodo.
M ga-achọ onye m hụrụ n’anyaN’okporo ámá nakwa n’ámá obodo.
M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.
3 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.+
M jụrụ ha, sị, ‘Ùnu hụrụ onye m hụrụ n’anya?’
4 Ozugbo m gafere ha,M hụrụ onye m hụrụ n’anya.
M jidere ya aka. Ekweghị m ahapụ yaRuo mgbe m kpọbatara ya n’ụlọ nne m,+N’ime ime ụlọ nwaanyị mụrụ m.
5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele na nne mgbada bi n’ọhịaNa-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyiNa unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+
6 “Gịnị bụ ihe a si n’ala ịkpa na-abịa nke yiri anwụrụ ọkụ,Nke e ji mea na frankinsensNa ihe dị iche iche na-esi ísì ọma onye ahịa na-ere mee ka ọ na-esi ísì ọma?”+
7 “Lee, ọ bụ ihe e ji ebu Solomọn.
Ndị dike iri isii n’ime ndị dike IzrelGbara ya gburugburu.+
8 Ha niile ji mma agha.
Ha niile bụ ndị agha a zụrụ nke ọma.
Onye ọ bụla kere mma agha ya n’úkwùKa ha jiri ya chebe ya, ka ihe ọ bụla ghara imenye ya ụjọ n’abalị.”
9 “Ọ bụ ihe e ji ebu* Eze Solomọn.
O ji osisi si Lebanọn rụọrọ ya onwe ya.+
10 O ji ọlaọcha rụọ ogidi* ya dị iche iche,Jirikwa ọlaedo rụọ ebe ọ na-adabere.
E ji ajị anụ na-acha pọpụl rụọ ebe a na-anọ ọdụ na ya.
Ụmụ nwaanyị Jeruselem mere ka ime yaMaa ezigbote mma.”
11 “Ụmụ nwaanyị Zayọn, gaanụKirie Eze SolomọnKa o kpu okpu nne ya+ kpaara yaN’ụbọchị ọ lụrụ nwaanyị,N’ụbọchị obi bụ ya sọ aṅụrị.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe ndina.”
^ Ihe a yiri oche ma ọ bụ ihe e ji edina ala e kpuchiri elu ya ekpuchi. E ji ya ebu ndị ukwu.
^ Ọ ga-abụ na ogidi ndị a bụ idé ndị ji elu ya.