Diuterọnọmi 27:1-26

  • A ga-ede Iwu ahụ na nkume (1-10)

  • Ndị ga-eguzo n’Ugwu Gerizim na n’Ugwu Ịbal (11-14)

  • Ọnụ a ga-abụ ndị mere ihe ọjọọ (15-26)

27  Mosis na ndị okenye Izrel wee nye ndị Izrel iwu, sị: “Meenụ ihe niile m na-enye unu n’iwu taa.  N’ụbọchị unu ga-agafe Osimiri Jọdan banye n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu ga-ebute nkume ndị buru ibu, dokọta ha ọnụ ma were ụrọ tee ha.*+  Mgbe unu gafechara, deenụ ihe niile e kwuru n’Iwu a na ha, ka unu wee banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,* otú Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà kwere unu ná nkwa.+  Mgbe unu gafechara Osimiri Jọdan, unu ga-ebute nkume ndị ahụ ma dokọta ha ọnụ n’Ugwu Ịbal,+ werekwa ụrọ tee ha,* otú m na-enye unu n’iwu taa.  Unu ga-arụkwara Jehova bụ́ Chineke unu ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, ya bụ, ebe ịchụàjà e ji nkume rụọ. Unu ejila ngwá ọrụ e ji ígwè rụọ waa ha.+  Unu ga-eji nkume ndị a na-awaghị awa rụọ ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu, chụọkwara Jehova bụ́ Chineke unu àjà a na-esu ọkụ na ya.  Unu ga-achụ àjà udo+ n’ebe ahụ ma rie ha n’ebe ahụ.+ Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu.+  Unu ga-edepụta ihe niile e kwuru n’Iwu a na nkume ndị ahụ nke ọma.”+  Mosis na ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, wee gwa ndị Izrel niile okwu, sị: “Ndị Izrel, nọrọnụ jụụ, geekwanụ ntị. Taa, ọ bụzi Jehova bụ́ Chineke unu nwe unu.+ 10  Geenụ ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu, meenụ ihe ndị o nyere n’iwu,+ sorokwanụ ntụziaka ya ndị m na-enye unu n’iwu taa.” 11  N’ụbọchị ahụ, Mosis nyere ndị Izrel iwu, sị: 12  “Ebo ndị a ga-eguzo n’Ugwu Gerizim+ gọzie ndị mmadụ mgbe unu gafechara Osimiri Jọdan: Simiọn, Livaị, Juda, Ịsaka, Josef, na Benjamin. 13  Ebo ndị a ga-eguzo n’Ugwu Ịbal+ bụọ ndị mmadụ ọnụ: Ruben, Gad, Asha, Zebulọn, Dan, na Naftalaị. 14  Ndị Livaị ga-agwa ndị Izrel niile okwu n’oké olu, sị:+ 15  “‘Onye mere arụsị a pịrị apị+ ma ọ bụ arụsị a kpụrụ akpụ,+ nke onye na-eme nkà rụrụ, ma zoo ya, a ga-abụ ya ọnụ, n’ihi na arụsị bụ ihe rụrụ arụ n’anya Jehova.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’*) 16  “‘Onye na-elelị nne ya ma ọ bụ nna ya, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 17  “‘Onye na-ewela ihe e ji kpaa ókè n’ala onye agbata obi ya azụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 18  “‘Onye na-eme ka onye ìsì gahie ụzọ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 19  “‘Onye na-ekpe onye mbịarambịa ma ọ bụ nwa na-enweghị nna* ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ+ ikpe na-ezighị ezi,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 20  “‘Onye ya na nwunye nna ya nwere mmekọahụ, a ga-abụ ya ọnụ, n’ihi na ọ kparịala nna ya.’*+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 21  “‘Onye ya na anụmanụ ọ bụla nwere mmekọahụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 22  “‘Onye ya na nwanne ya nwaanyị, ya bụ, nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwaanyị nne ya mụrụ, nwere mmekọahụ,+ a ga-abụ ya ọnụ.’ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 23  “‘Onye ya na nne nwunye ya nwere mmekọahụ, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 24  “‘Onye si n’ebe o zoro pụta gbuo onye agbata obi ya, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 25  “‘Onye na-anara aka azụ ka o gbuo onye aka ya dị ọcha, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 26  “‘Onye na-anaghị akwado ihe ndị e kwuru n’Iwu a ma na-eme ha eme, a ga-abụ ya ọnụ.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “were nzụ na-acha ọcha tee ha.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “were nzụ na-acha ọcha tee ha.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “chịliela uwe mwụda nna ya elu.”