Diuterọnọmi 32:1-52

  • Abụ Mosis (1-47)

    • Jehova bụ Oké Nkume anyị (4)

    • Ndị Izrel chefuru Oké Nkume ha (18)

    • “Ọ bụ m ga-abọ ọbọ” (35)

    • “Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ” (43)

  • Mosis ga-anwụ n’Ugwu Nibo (48-52)

32  “Eluigwe, gee ntị ka m kwuo okwu,Ka ụwa nụrụkwa okwu si m n’ọnụ.   Ntụziaka m ga-ezo ka mmiri. Okwu m ga na-adasị ka igirigi,Ka mmiri nke na-abụsa n’ahịhịa,Nakwa ka nnukwu mmiri nke na-ezosa n’ahịhịa ndụ.   N’ihi na m ga-akọsa aha Jehova.+ Meenụ ka a mara otú Chineke anyị si dị ebube!+   Ọ bụ Oké Nkume. Ihe ọ na-eme zuru okè,+N’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’ihe niile ọ na-eme.+ Ọ bụ Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi,+ onye na-anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+ Ọ bụ onye ezi omume na onye na-eme ihe ziri ezi.+   Ọ bụ ha mere ihe na-adịghị mma.+ Ha abụghị ụmụ ya. Ọ bụ ha ka nsogbu si n’aka.+ Ha bụ ọgbọ jọgburu onwe ya, nke rụkwara arụ.+   Unu ndị nzuzu na-amaghị ihe,+Ọ̀ bụ otú a ka unu kwesịrị isi na-emeso Jehova?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị ya bụ Nna unu onye mere ka unu dịrị,+Onye kere unu ma mee ka unu bụrụ mba?   Chetanụ oge ochie. Chebaranụ ihe ndị mere n’ọgbọ ndị gara aga echiche. Jụọnụ nna unu, ha ga-akọrọ unu.+ Jụọkwanụ ndị okenye unu, ha ga-agwa unu.   Mgbe Onye Kacha Elu kenyere mba dị iche iche ala ha,+Mgbe o kewara ụmụ Adam,* otu onye na ibe ya,+O ji otú ndị Izrel hà+Kpaara ndị dị iche iche ókè.+   N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya.+ Ọ bụ Jekọb ka o ketara.+ 10  Ọ hụrụ ya n’ala ịkpa,+N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụ ọhịa na-agbọ ụja na ya.+ Ọ gbara ya gburugburu ma lekọta ya,+Chebekwa ya ka mkpụrụ anya ya.+ 11  Otú ahụ ugo si eme ka ụmụ ya si n’akwụ́ fepụ mgbe ọ na-akụziri ha ife efe,Na-erugharị n’elu ụmụ ya,Gbasaa nku ya, buru ha,Buru ha na nku ya,+ 12  Ọ bụ otú ahụ ka naanị Jehova si na-edu ya.*+ E nweghị chi mba ọzọ so ya.+ 13  O mere ka ọ nọkwasị n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+ O wee rie ihe ubi mepụtara.+ O nyere ya mmanụ aṅụ nke si ná nnukwu nkumeNa mmanụ nke si n’oké nkume siri ike, 14  Nyekwa ya bọta e ji mmiri ara ehi mee na mmiri ara ewu na atụrụ,Ha na atụrụ ndị kacha mma*Na ebule ndị si Beshan na mkpi,Nakwa ọka wit kacha mma.+ Ị ṅụkwara mmanya a zọchapụtara ná mkpụrụ vaịn. 15  Mgbe Jeshurọn* buru ibu, o nupụrụ isi. I buola ibu, ị gbaala agba, afọ gị ebuola ibu.+ O wee hapụ Chineke, onye kere ya,+Ledakwa Oké Nkume na-azọpụta ya anya. 16  Ha fere chi ndị mba ọzọ wee kpasuo ya iwe.+ Ha jikwa ihe dị iche iche rụrụ arụ na-eme ka obi jọọ ya njọ.+ 17  Ha nọ na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke,+Chi dị iche iche ha na-amaghị,Chi ndị pụtara ọhụrụ,Chi dị iche iche nna nna unu hà na-amaghị. 18  I chefuru Oké Nkume+ ahụ bụ́ nna gị. I chetaghịkwa Chineke, onye mere ka ị dịrị.+ 19  Mgbe Jehova hụrụ ihe ha mere, ọ jụrụ ha,+N’ihi na ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị kpasuru ya iwe. 20  O wee sị, ‘Agaghị m enyere ha aka.*+ M ga-ahụ ihe ga-emecha mee ha. N’ihi na ha bụ ọgbọ rụrụ arụ,+Ụmụ a na-ekwesịghị ịtụkwasị obi.+ 21  Ha efeela ihe na-abụghị chi wee kpasuo m iwe.+ Ha efeela arụsị ha na-abaghị uru wee mee ka obi jọọ m njọ.+ N’ihi ya, m ga-eji ndị na-enweghị ihe ha bụ mee ka obi jọọ ha njọ.+ M ga-ejikwa mba dị nzuzu kpasuo ha iwe.+ 22  N’ihi na iwe m enwurula ka ọkụ.+ Ọ ga-eregide ọkụ ruo n’ili.*+ Ọ ga-erechapụkwa ụwa na ihe dị n’ime ya,Mụnyekwa ntọala ugwu dị iche iche ọkụ. 23  M ga-eme ka nsogbu ndị na-abịara ha dịkwuo ọtụtụ. M ga-agbacha ha akụ́ m niile. 24  Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ.+ Oké ahụ́ ọkụ ga-eregbu ha, e bibiekwa ha kpamkpam.+ M ga-ezite anụ ọhịa ndị ga-ata ha,+Nakwa anụ ndị na-arị arị ka ha tanye ha elò n’ahụ́. 25  A ga-eji mma agha gbawa ndị nọ n’èzí aka nwa.+ Ụjọ ga-ejide ndị nọ n’ime ụlọ,+Ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,Ma nwa a mụrụ ọhụrụ ma nwoke isi awọ́.+ 26  M gaara asị: “M ga-achụsasị ha. M ga-eme ka ndị mmadụ ghara icheta ha ọzọ.” 27  Ma ekwughị m otú ahụ n’ihi ihe ndị iro m ga-ekwu,+N’ihi na ndị iro m nwere ike ịghọtahie ihe merenụ.+ Ha nwere ike ịsị: “Anyị ji ike anyị merie ha.+ Ọ bụghị Jehova mere ihe a niile.” 28  N’ihi na ha bụ mba na-enweghị uche,*Ha anaghịkwa aghọta ihe.+ 29  A sị nnọọ na ha ma ihe,+ ha gaara echebara ihe a echiche.+ Ha gaara echebara ihe ga-emecha mee ha echiche.+ 30  Olee otú otu onye ga-esi chụọ otu puku (1,000) mmadụ ọsọ,Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri (10,000) ọsọ?+ Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ọ̀ hapụrụ ha,+Jehova enyefeekwa ha n’aka ndị iro ha. 31  N’ihi na oké nkume ha adịghị ka Oké Nkume anyị,+Ndị iro anyị ghọtadịrị na ọ bụ eziokwu.+ 32  N’ihi na ha dị ka osisi vaịn nke si SọdọmNakwa nke si n’ubi vaịn ndị dị na Gọmọra.+ Mkpụrụ vaịn ha bụ mkpụrụ vaịn na-egbu mmadụ,Ụyọkọ ha na-elu ilu.+ 33  Mmanya ha bụ elò agwọ,Bụrụkwa elo agwọ ubí. 34  Ọ̀ bụ na amaghị m ihe niile ha mere? Ọ̀ bụ na akwasaghị m ha n’ebe m na-akwasa ihe?+ 35  Ọ bụ m ga-abọ ọbọ, ọ bụkwa m ga-akwụ ụgwọ,+N’oge a kara aka mgbe ụkwụ ha ga-amịchapụ,+N’ihi na ụbọchị nsogbu ga-abịara ha eruwela. A ga-emekwa ha ihe e kwesịrị ime ha n’egbughị oge.’ 36  N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe.+ Ọ ga-emetekwara ndị ohu ya ebere+Mgbe ọ hụrụ na ike agwụla haNakwa mgbe ọ hụrụ na ọ bụ naanị onye na-enweghị onye na-enyere ya aka na onye na-enweghị ume fọrọ. 37  Ọ ga-asịzi, ‘Olee ebe chi ha dị iche iche nọ,+Ndị bụ́ oké nkume ha gbabara na ya ka ha chebe ha, 38  Bụ́ ndị na-eri abụba anụ ndị ha ji chụọ àjà dị iche iche,*Na-aṅụkwa mmanya ha ji chụọ àjà mmanya?+ Ka ha bilie nyere unu aka. Ka ha bụrụ ebe unu ga-agbaba. 39  Ọ bụ m bụ Chineke.+ E nweghị chi ọzọ ma e wepụ m.+ M na-eme ka a nwụọ, m na-emekwa ka a dị ndụ.+ M na-emerụ mmadụ ahụ́,+ m ga-agwọkwa mmadụ,+E nweghịkwa onye ga-anapụta onye ọ bụla n’aka m.+ 40  N’ihi na m na-eweli aka m eluṄụọ iyi, sị: “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,”+ 41  Mgbe m ga-amụ mma agha m nke na-egbu maramara,Ma jikere ikpe ikpe,+M ga-abọ ọbọ n’isi ndị iro m,+Kwụọkwa ndị kpọrọ m asị ụgwọ. 42  M ga-eme ka akụ́ m ṅụgide ọbara, ya egbuwe ya ka mmanya. Mma agha m ga-erikwa anụ ahụ́. Ọ ga-aṅụ ọbara ndị e gburu egbu na nke ndị a dọtara n’agha,Riekwa isi ndị ndú nke onye iro.’ 43  Unu mba niile, soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ,+N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya.+ Ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ ihe ha mere,+Kpuchiekwara ala ndị ya mmehie.”* 44  Mosis bịara gụpụta okwu niile dị n’abụ a ná ntị ndị Izrel,+ ya na Hoshia*+ nwa Nọn. 45  Mgbe Mosis gwachara ndị Izrel niile ihe a niile, 46  ọ sịrị ha: “Burunụ okwu niile m ji na-adọ unu aka ná ntị taa n’obi,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya na-eme ihe niile e kwuru n’Iwu a.+ 47  N’ihi na ọ bụghị okwu na-agaghị abara unu uru, kama ọ bụ okwu ga-eme ka unu dị ndụ.+ Okwu a ga-emekwa ka unu bitee aka n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu nweta.” 48  Jehova gwakwara Mosis n’ụbọchị ahụ, sị: 49  “Gbagoo n’ugwu Abarim a,+ bụ́ Ugwu Nibo,+ nke dị n’ala Moab, nke chere ihu na Jeriko, ka ị hụ ala Kenan, bụ́ ala m na-enye ndị Izrel ka ọ bụrụ nke ha.+ 50  Ị ga-anwụ n’ugwu ahụ ị na-agbago, e lie gị otú e liri ndị nna nna gị, otú Erọn nwanne gị nwụrụ n’Ugwu Họọ,+ e lie ya otú e liri ndị nna nna ya, 51  n’ihi na unu abụọ erubereghị m isi n’ihu ndị Izrel, na mmiri Meriba+ nke dị na Kedesh, n’ala ịkpa Zin, n’ihi na unu edoghị m nsọ n’ihu ndị Izrel.+ 52  Ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye n’ala ahụ m na-enye ndị Izrel.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “agbụrụ ụmụ mmadụ.”
Ya bụ, Jekọb.
Na Hibru, “Ha na abụba atụrụ.”
Jeshurọn pụtara “Onye Ezi Omume.” Ọ bụ aha a na-etu Izrel.
Na Hibru, “M ga-ezoro ha ihu m.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “na-anaghị anara ndụmọdụ.”
Ma ọ bụ “na-eri ihe ndị kacha mma n’àjà ha dị iche iche.”
Ma ọ bụ “Meekwa ka ala ndị ya dị ọcha.”
Hoshia bụ ezigbo aha Joshụa. Ọ bụ mkpọbiri Hoshaya, nke pụtara “Onye Jaa Zọpụtara; Jaa Azọpụtala.”