Emọs 9:1-15
9 Ahụrụ m Jehova+ ka ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà, sị: “Tie ihe n’isi ogidi ji ụlọ, ụlọ ahụ ga-amakwa jijiji. Kụpụ isi ogidi ahụ, m ga-ejikwa mma agha gbuo onye fọdụrụ n’ime ha. O nweghị onye n’ime ha ga-agbapụ. O nweghịkwa onye chọrọ ịgbapụ ga-agbalaga.+
2 Ọ bụrụ na ha egwuo ala banye n’ime ili,*Aka m ga-esi ebe ahụ kpụrụ ha.
Ọ bụrụkwa na ha agaa eluigwe,M ga-esi ebe ahụ chụda ha.
3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel,M ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ, jidekwa ha.+
Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri ka m ghara ịhụ ha,M ga-agwa agwọ ka ọ taa ha n’ebe ahụ.
4 Ọ bụrụ na ndị iro ha adọrọ ha n’agha,M ga-agwa mma agha ka o gbuo ha, ọ ga-egbukwa ha ebe ahụ.+
M ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+
5 Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kpara ala* a aka,O wee gbazee.+ Ndị niile bi na ya ga-erukwa uju.+
Ọ ga-etokwa ka Osimiri Naịl,Talatakwa ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt.+
6 ‘Jehova bụ aha+Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+
7 ‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’anya m?’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
‘Ọ̀ bụ na esighị m n’Ijipt kpọpụta Izrel,+Si na Krit kpọpụta ndị Filistia,+ sikwa na Kia kpọpụta Siria?’+
8 ‘Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze na-eme mmehie.
Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+
Ma, ọ gaghị ekpochapụ ndị si n’ezinụlọ Jekọb kpamkpam.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
9 ‘N’ihi na m na-enye iwu
Ka a chụsasịa ndị Izrel ná mba niile,+Si otú ahụ yọgharịa ha otú mmadụ si ayọgharị myọ,Ma, otu obere okwute agaghị ada n’ala.
10 A ga-eji mma agha gbuo ndị m niile na-eme mmehie,Ndị na-asị: “Ọdachi agaghị abịaru anyị nso ma ọ bụ rute anyị.”’
11 ‘N’oge ahụ, m ga-ebulite ụlọ ndò* Devid+ dara ada,Rụziekwa ebe* ndị a kwadara akwada.
M ga-arụzi ebe ndị e bibiri ebibi na ya.
M ga-arụghachi ha ka ha dịrị otú ha dị ọtụtụ afọ gara aga,+
12 Ka ndị m weghara ihe fọdụrụ n’Ịdọm,+Wegharakwa mba niile na-aza aha m.’ Ọ bụ Jehova, onye na-eme ihe a, kwuru ya.
13 Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịaMgbe ọ ga-abụ, tupu e wechaa ihe niile dị n’ubi, oge e ji akọ ihe ga-eru.
Tupu a zọchaa mkpụrụ vaịn niile, oge e ji agha mkpụrụ ga-eru.+
Mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta.+
Ugwu nta niile ga na-agbapụtakwa mmanya.*+
14 M ga-akpọlata ndị m Izrel a dọọrọ n’agha.+
Ha ga-arụzikwa obodo ndị tọgbọ chakoo ma biri n’ime ha.+
Ha ga-akọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya si na ha,+Kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ si na ha.’+
15 ‘M ga-akụ ha n’ala ha dị ka mkpụrụ.
A gaghị efopụkwa ha ọzọN’ala ha nke m nyere ha.’+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu kwuru ihe a.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ụwa.”
^ Ma ọ bụ “ụlọikwuu.”
^ Ma ọ bụ “ebe ha.”
^ Na Hibru, “ga-agbazekwa.”