Joshụa 15:1-63

  • Ala ebo Juda ketara (1-12)

  • Keleb nyere nwa ya nwaanyị ala (13-19)

  • Obodo ndị dị na Juda (20-63)

15  Ala ebo Juda ketara+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ malitere n’ókè ala Ịdọm,+ ya bụ, n’ala ịkpa Zin, ruo ebe Negeb* gwụrụ n’ebe ndịda.  N’ebe ndịda, ala ha malitere n’ọnụ mmiri Oké Osimiri Nnu.+ Ọnụ mmiri ahụ dị ebe e si aga n’ebe ndịda.  O si ebe ahụ ruo n’ebe ndịda n’ụzọ e si agbago Akrabim,+ garakwa ruo Zin, sikwa n’ebe ndịda ahụ ruo Kedesh-bania,+ na-agakwa ruo Hezrọn. O sikwa ebe ahụ ruo Ada, garakwa ruo Kaka.  O ruru Azmọn,+ ruokwa na Ndagwurugwu* Ijipt,+ ma kwụsị n’Oké Osimiri Mediterenian.* Ala a ka ha ketara n’ebe ndịda.  N’ebe ọwụwa anyanwụ, ala ha malitere n’Oké Osimiri Nnu ruo ná nsọtụ Osimiri Jọdan. N’ebe ugwu, ọ malitere n’ọnụ mmiri oké osimiri ahụ, ná nsọtụ Osimiri Jọdan,+  gara ruo Bet-họgla,+ ruokwa n’ebe ugwu Bet-araba.+ O sikwa ebe ahụ gara ruo na nkume Bohan,+ nwa Ruben.  O ruru Diba, n’ebe Ndagwurugwu Ekọ,+ ruokwa ebe ugwu na Gilgal.+ Gilgal dị ebe e si agbago Adọmịm n’ebe ndịda ndagwurugwu. Ala ha gawakwara ruo na mmiri En-shimesh+ ma kwụsị na En-rogel.+  Ọ gakwaara ruo na Ndagwurugwu Hinọm,+ garakwa ruo ná mkpọda obodo ndị Jebus+ nke dị n’ebe ndịda, ya bụ, Jeruselem.+ Ala ha rukwara n’ugwu dị n’agbata ebe ọdịda anyanwụ Ndagwurugwu Hinọm na ebe Ndagwurugwu Refeyim gwụrụ n’ebe ugwu.  O sikwa n’ugwu ahụ ruo n’isi mmiri Neftoa,+ ruokwa n’obodo ndị dị n’Ugwu Ifrọn. O rukwara Beala, ya bụ, Kiriat-jierim.+ 10  O sikwa n’ebe ọdịda anyanwụ Beala ruo n’Ugwu Sia, garakwa ruo ná mkpọda Ugwu Jierim n’ebe ugwu, ya bụ, Kesalọn. Ọ gakwaara ruo Bet-shimesh,+ ruokwa Timna.+ 11  O ruru ná mkpọda Ekrọn+ n’ebe ugwu, ruokwa Shikerọn, gara ruo n’Ugwu Beala, ruokwa Jabniel ma kwụsị n’oké osimiri. 12  N’ebe ọdịda anyanwụ, ala ha kwụsịrị n’Oké Osimiri Mediterenian*+ nakwa n’ala dị n’akụkụ ya. Ebe ndị a niile bụ ókè ala ụmụ Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 13  Jehova gwara Joshụa ka o nye Keleb+ nwa Jefune ala ná mpaghara ebe o nyere ụmụ Juda. Ya enye ya Kiriat-aba (Aba a bụ nna Anak), ya bụ, Hebrọn.+ 14  N’ihi ya, Keleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ n’ebe ahụ.+ Ha bụ, Shishaị, Ahaịman, na Talmaị.+ 15  O sikwa ebe ahụ gaa lụso ndị bi na Diba agha.+ (Ihe a na-akpọbu Diba bụ Kiriat-sifa.) 16  Keleb wee sị: “Onye ọ bụla nke lụsoro Kiriat-sifa agha ma weghara ya, m ga-akpọnye ya Aksa nwa m nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 17  Ọtniel+ nwa Kinaz,+ bụ́ nwanne Keleb, weghaara ya. N’ihi ya, Keleb kpọnyere ya Aksa nwa ya nwaanyị+ ka ọ bụrụ nwunye ya. 18  Mgbe Aksa na-ala ebe di ya, ọ gwara di ya ka ọ rịọta nna ya ala. Aksa wee si n’elu jakị ọ nọ rịtuo.* Keleb jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ?”+ 19  Ya asị: “Biko, nye m onyinye gosiri na ị gọziela m, n’ihi na ọ bụ otu ibé ala nke dị n’ebe ndịda* ka i nyere m. Biko, nyekwuo m Gọlọt-meyim.”* O wee nye ya Gọlọt Mgbago na Gọlọt Ndịda. 20  Ihe a bụ ala e kenyere ebo Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 21  Obodo ndị dị na nsọtụ ebo Juda, n’ebe dị nso n’ókè ha na Ịdọm,+ n’ebe ndịda, bụ Kabzil, Ịda, Jegọ, 22  Kaịna, Dimona, Adeda, 23  Kidesh, Hezọ, Itnan, 24  Zif, Tilem, Bielọt, 25  Hezọ-hadata, na Kiriọt-hezrọn, ya bụ, Hezọ. 26  Obodo ndị ọzọ bụ Emam, Shima, Moleda,+ 27  Heza-gada, Heshmọn, Bet-pelet,+ 28  Heza-shual, Bia-shiba,+ Biziotaya, 29  Beala, Ayịm, Izem, 30  Eltolad, Kisil, Họma,+ 31  Ziklag,+ Madmana, Sansana, 32  Lebeọt, Shilhim, Eyin, na Rimọn.+ Ha dị obodo iri abụọ na itoolu, ha na ógbè ha niile. 33  Obodo ndị dị na Shefila*+ bụ: Eshtaọl, Zora,+ Ashna, 34  Zanoa, En-ganim, Tapua, Ịnam, 35  Jamọt, Adọlam,+ Soko, Azika,+ 36  Shearem,+ Aditem, Gedira na Gederọtem.* Ha dị obodo iri na anọ, ha na ógbè ha niile. 37  Obodo ndị ọzọ bụ Zinan, Hadasha, Migdal-gad, 38  Daịlien, Mizpe, Jọktiel, 39  Lekish,+ Bọzkat, Eglọn, 40  Kabọn, Lamam, Kitlish, 41  Gedirọt, Bet-degọn, Neama, na Makida.+ Ha dị obodo iri na isii, ha na ógbè ha niile. 42  Obodo ndị ọzọ bụ Libna,+ Ịta, Eshan,+ 43  Ịfta, Ashna, Nizib, 44  Kaịla, Akzib, na Marisha. Ha dị obodo itoolu, ha na ógbè ha niile. 45  Obodo ndị ọzọ bụ Ekrọn na ime obodo ndị dị ya nso,* nakwa ógbè ya niile. 46  Obodo ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ Ekrọn bụ obodo niile dị n’akụkụ Ashdọd na ógbè ha niile. 47  Obodo ọzọ bụ Ashdọd+ na ime obodo ndị dị ya nso* nakwa ógbè ya niile. Ọzọ bụ Gaza+ na ime obodo ndị dị ya nso nakwa ógbè ya niile, ruokwa Ndagwurugwu Ijipt, na Oké Osimiri Mediterenian* na obodo dị ya n’akụkụ.+ 48  Obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu bụ Shemia, Jatia,+ Soko, 49  Dana, Kiriat-sana, ya bụ, Diba. 50  Obodo ndị ọzọ bụ Enab, Eshtemo,+ Enim, 51  Goshen,+ Holọn, na Gaịlo.+ Ha dị obodo iri na otu, ha na ógbè ha niile. 52  Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Ishan, 53  Jenim, Bet-tapua, Afika, 54  Họmta, Kiriat-aba, ya bụ, Hebrọn,+ nakwa Zayọ. Ha dị obodo itoolu, ha na ógbè ha niile. 55  Obodo ndị ọzọ bụ Meyọn,+ Kamel, Zif,+ Jọta, 56  Jezril, Jọkdiam, Zanoa, 57  Keyin, Gibia, na Timna.+ Ha dị obodo iri, ha na ógbè ha niile. 58  Obodo ndị ọzọ bụ Halhọl, Bet-zọọ, Gidọ, 59  Mearat, Bet-enọt, na Eltekọn. Ha dị obodo isii, ha na ógbè ha niile. 60  Obodo ndị ọzọ bụ Kiriat-bel, ya bụ, Kiriat-jierim,+ nakwa Raba. Ha dị obodo abụọ, ha na ógbè ha niile. 61  Obodo ndị dị n’ala ịkpa bụ Bet-araba,+ Midin, Sikeka, 62  Nibshan, Obodo Nnu, na En-gedi.+ Ha dị obodo isii, ha na ógbè ha niile. 63  Ma, ndị Juda achụpụlighị+ ndị Jebus+ bi na Jeruselem.+ Ndị Jebus na ndị Juda bizi na Jeruselem ruo taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ebe ndịda.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”
O nwere ike ịbụ, “Aksa wee nọrọ n’elu jakị ọ nọ kụọ aka.”
Ma ọ bụ “na Negeb.”
Gọlọt-meyim pụtara “Isi Mmiri.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
O nwere ike ịbụ, “Gedira na ogige atụrụ.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Na Hibru, “n’Oké Osimiri ahụ.”