Levitikọs 27:1-34

  • Ịgbara ihe ndị e kwere ná nkwa (1-27)

    • Mmadụ (1-8)

    • Anụmanụ (9-13)

    • Ụlọ (14, 15)

    • Ubi (16-25)

    • Mmadụ ma ọ bụ anụmanụ e bu ụzọ mụọ (26, 27)

  • Ihe ndị e wepụtara iche ka ha bụrụzie nke Jehova (28, 29)

  • Ịgbara otu ụzọ n’ụzọ iri (30-34)

27  Jehova gwakwara Mosis, sị:  “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ekwe nkwa pụrụ iche+ na ọ ga-enye Jehova ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa mmadụ,*  ọnụ ahịa nwoke nọ n’agbata afọ iri abụọ na afọ iri isii ga-abụ shekel* ọlaọcha iri ise ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.  Ma ọnụ ahịa nwaanyị ga-abụ shekel iri atọ.  Ọ bụrụ ndị nọ n’agbata afọ ise na afọ iri abụọ, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel iri abụọ, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel iri.  Ọ bụrụ ndị nọ n’agbata otu ọnwa na afọ ise, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel ọlaọcha ise, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel ọlaọcha atọ.  “‘Ọ bụrụ ndị dị afọ iri isii ma ọ bụ karịa, ọnụ ahịa nwoke ga-abụ shekel iri na ise, ọnụ ahịa nwaanyị abụrụ shekel iri.  Ma ọ bụrụ na onye kwere nkwa ahụ dara ogbenye nke na ọ gaghị akwụli ọnụ ahịa e kwuru,+ onye ahụ e kwere ná nkwa ga-aga guzoro n’ihu onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ ego ole onye ahụ kwere nkwa ga-akwụli ka onye nchụàjà ga-eji ekpebi ego ole ọ ga-agwa ya kwụọ.+  “‘Ọ bụrụ anụmanụ ka e kwere ná nkwa, ya bụ, anụmanụ a ga-ejili chụọrọ Jehova àjà, ihe ọ bụla a ga-enye Jehova ga-abụzi ihe dị nsọ. 10  Ọ gaghị eji ọzọ dochie ya. Ọ gaghịkwa eji nke ahụ́ dị mma gbanwere nke ahụ́ na-adịghị mma ma ọ bụ jiri nke ahụ́ na-adịghị mma gbanwere nke ahụ́ dị mma. Ma ọ bụrụ na o jiri anụmanụ ọzọ gbanwere ya, ma nke ahụ a gbanwere agbanwe ma nke ahụ e ji gbanwere ya ga-abụzi ihe dị nsọ. 11  Ọ bụrụ na ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha,+ nke a na-agaghị ejili chụọrọ Jehova àjà, ọ ga-akpụta anụ ahụ ma kwụwa ya n’ihu onye nchụàjà. 12  Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ otú anụmanụ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ego ole ọ bụla onye nchụàjà kwuru ka ọ ga-abụ. 13  Ma ọ bụrụ na e nwee ka o si chọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa anụmanụ ahụ, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ahụ.+ 14  “‘Ọ bụrụ na mmadụ enye Jehova ụlọ ya ka ọ bụrụ ihe dị nsọ, onye nchụàjà ga-ekwu ọnụ ahịa ya. Ọ bụ otú ụlọ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ọ bụ ihe onye nchụàjà kwuru ga-abụ ọnụ ahịa ya.+ 15  Ma ọ bụrụ na onye ahụ nyere Chineke ụlọ ya achọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ. Ụlọ ahụ ga-abụzi nke ya. 16  “‘Ọ bụrụ na e nwere ebe mmadụ nyere Jehova n’ubi o ketara, ọ bụ mkpụrụ ole a ga-agha na ya ka a ga-eji kpebie ego ole a ga-akwụ maka ya: ọ bụrụ na mkpụrụ a ga-agha na ya bụ ọka bali dị otu homa,* ọ ga-abụ shekel ọlaọcha iri ise. 17  Ọ bụrụ na o nyere ubi ya malite n’afọ Nnwere Onwe,*+ a gaghị agbanwe ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya. 18  Ọ bụrụ na afọ Nnwere Onwe agafeela tupu ya enye Chineke ubi ahụ, onye nchụàjà ga-eji afọ ole fọrọ tupu afọ Nnwere Onwe ọzọ eruo gbakọọrọ ya ego ya, wepụzie ya n’ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya.+ 19  Ma ọ bụrụ na e nwee ka onye nyere ubi ahụ si chọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ, ubi ahụ abụrụzie nke ya. 20  Ọ bụrụ na ọ zụrụghachighị ubi ahụ, e wee resị ya onye ọzọ, ọ gaghị azụrụghachi ya ọzọ. 21  Mgbe onye ahụ ga-esepụ aka n’ubi ahụ n’afọ Nnwere Onwe, ọ ga-abụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. Ọ ga-abụ ubi e wepụtara iche ka ọ bụrụ nke Chineke. Ọ ga-abụzi nke ndị nchụàjà.+ 22  “Ọ bụrụ na mmadụ enye Jehova ubi ọ zụrụ azụ nke na-esoghị n’ala o ketara,+ 23  onye nchụàjà ga-agbakọrọ ya ego ole ga-abụ ọnụ ahịa ya ruo n’afọ Nnwere Onwe. Ọ ga-akwụkwa ego ahụ n’ụbọchị ahụ.+ Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. 24  N’afọ Nnwere Onwe, onye ọ zụrụ ubi ahụ, ya bụ, onye nwebu ala ahụ, ga-ewereghachi ya.+ 25  “‘Ọ bụ shekel dị n’ebe nsọ ka a ga-eji na-ekpebi ọnụ ahịa ọ bụla. Otu shekel kwesịrị ịdị gira* iri abụọ. 26  “‘Ma, e nweghị onye kwesịrị inye Chineke anụmanụ e bu ụzọ mụọ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ, n’ihi na anụmanụ ọ bụla e bu ụzọ mụọ bụ nke Jehova.+ Ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ atụrụ, ọ bụ Jehova nwe ya.+ 27  Ọ bụrụ na anụmanụ e bu ụzọ mụọ bụ anụ na-adịghị ọcha, ya abụrụkwa na onye wetara ya chọrọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ.+ Ma ọ bụrụ na a zụrụghachighị ya, a ga-ere ya ọnụ ahịa ahụ e kwuru. 28  “‘Ma, ọ bụrụ na mmadụ esi n’ihe ndị o nwere wepụta ihe ọ bụla iche ka ọ bụrụzie nke Jehova, e nweghị ike ire ihe ahụ ere ma ọ bụ zụrụghachi ya, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ubi. Ihe ọ bụla e wepụtara iche ka ọ bụrụ nke Jehova bụ ihe kacha nsọ n’anya ya.+ 29  E nweghịkwa onye a mara ikpe ọnwụ* a ga-agbara agbara.+ A ga-egburịrị ya.+ 30  “‘Otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla+ ala mepụtara bụ nke Jehova, ma ọ̀ bụ ihe mkpụrụ a ghara n’ubi mepụtara ma ọ̀ bụ mkpụrụ osisi. Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. 31  Ọ bụrụ na e nwee ka mmadụ si chọọ ịzụrụghachi nke ọ bụla n’otu ụzọ n’ụzọ iri o wetara, ọ ga-eweta ọnụ ahịa ya, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ahụ. 32  Unu ga-enye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na ìgwè atụrụ unu. Mgbe onye na-azụ atụrụ na-agụ anụmanụ ya ọnụ,* ọ ga-ewepụtara Chineke anụ nke iri. Anụmanụ nke iri ọ bụla dị nsọ. 33  Ọ gaghị eleruwe anụmanụ ahụ anya ka ọ mara ma ahụ́ ọ̀ dị ya mma ma ọ̀ bụ na ahụ́ adịghị ya mma. Ọ gaghịkwa eji ọzọ gbanwere ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwaa anwa chọọ ịgbanwere ya, ma anụ ahụ ma nke o ji agbanwere ya ga-abụzi ihe dị nsọ.+ A gaghị azụrụghachi ha.’” 34  Ihe ndị a bụ iwu Jehova nyere Mosis n’Ugwu Saịnaị+ ka o nye ndị Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’afọ Jubili.”
Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “onye a ga-egbu egbu.”
Otú onye na-azụ atụrụ si agụ anụ ya ọnụ bụ ime ka ha si n’okpuru mkpara ya na-agafe.