Levitikọs 6:1-30

  • Ihe ọzọ e kwuru gbasara ịchụ àjà ikpe ọmụma (1-7)

  • Iwu e nyere gbasara àjà dị iche iche (8-30)

    • Àjà a na-esu ọkụ (8-13)

    • Àjà ọka (14-23)

    • Àjà mmehie (24-30)

6  Jehova wee gwa Mosis, sị:  “Ọ bụrụ na mmadụ* emehie wee mejọọ Jehova,+ ghọgbuo mmadụ ibe ya n’ihe e nyere ya ka o lekọta+ ma ọ bụ n’ihe e nyere ya ka o jide, ma ọ bụkwanụ ya ezuo mmadụ ibe ya ohi ma ọ bụ jiri aghụghọ nara ya ihe,  ma ọ bụkwanụ ya ahụ ihe furu efu ma ghaa ụgha na ya ahụghị ya, ọ bụrụkwa na ọ ṅụrụ iyi na ya emeghị nke ọ bụla n’ime mmehie ndị a,+ ihe a ka ọ ga-eme:  Ọ bụrụ na o mehiere, ikpe amakwa ya, ọ ga-eweghachi ihe o zuru, ihe o ji aghụghọ nara, ihe e nyere ya ka o lekọta, ma ọ bụ ihe furu efu ọ hụrụ,  ma ọ bụkwanụ ihe ọ bụla ọ ṅụrụ iyi na ya ewereghị. Ọ ga-akwụcha ụgwọ ihe ahụ.+ Ọ ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ole ihe ahụ bụ. Ọ ga-enye ya onye nwe ihe ahụ n’ụbọchị e gosiri na ikpe mara ya.  Ọ ga-esi n’ìgwè atụrụ wetara onye nchụàjà ebule ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ọ ga-achụrụ Jehova maka na ikpe mara ya. Ebule ọ ga-eweta ga-eru ego ole e kwuru na anụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma kwesịrị iru.+  Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova. A ga-agbagharakwa ya ihe ọ bụla o mere nke mere ka ikpe ma ya.”+  Jehova gwakwara Mosis, sị:  “Nye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iwu, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà a na-esu ọkụ:+ Anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ ga-adị n’ekwú ebe ịchụàjà abalị niile ruo ụtụtụ. A ga-emekwa ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà. 10  Onye nchụàjà ga-eyiri uwe linin+ o ji arụ ọrụ nchụàjà, yirikwa uwe úkwù*+ yichie ọtọ ya. Ọ ga-ekpopụzi ntụ*+ si n’àjà a na-esu ọkụ nke ọkụ repịara n’ebe ịchụàjà ma kposa ya n’akụkụ ebe ịchụàjà. 11  Ọ ga-eyipụ uwe ya+ yiri uwe ọzọ ma buru ntụ ahụ gaa n’ebe dị ọcha, ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu.+ 12  A ga-eme ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà ahụ. Ọ gaghị anyụ anyụ. Onye nchụàjà ga na-esonye nkụ+ na ya kwa ụtụtụ ma na-edo anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ n’usoro n’elu ya. Ọ ga na-esukwa abụba anụ e ji achụ àjà udo ọkụ n’elu ya ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ.+ 13  A ga-eme ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà mgbe niile. Ọ gaghị anyụ anyụ. 14  “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà ọka:+ Ọ bụ ụmụ Erọn ndị nwoke ga na-eweta ya n’ihu Jehova, n’ihu ebe ịchụàjà. 15  Otu n’ime ha ga-esi n’ọka ahụ e gwere nke ọma e ji achụ àjà ọka kporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya, ya na mmanụ ya na frankinsens niile a tụkwasịrị n’elu ya. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Ọ bụ ya nọchiri anya àjà ọka e wetara.+ 16  Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eri ihe fọrọ na ya.+ A ga-eji ya mee achịcha na-ekoghị eko. A ga-anọkwa n’ebe dị nsọ rie ya. Ha ga-anọ n’ogige ụlọikwuu nzute rie ya.+ 17  A gaghị etinye ya ihe na-eko achịcha.+ Enyela m ha ya ka ọ bụrụ òkè ha nke si n’àjà e suru ọkụ+ a chụụrụ m. Ọ bụ ihe kacha nsọ,+ dị ka àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma. 18  Nwoke ọ bụla n’ime ụmụ Erọn ga-eri ya.+ Ọ bụ òkè ha nke ga-adịgide n’ọgbọ unu niile, nke si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+ Ihe ọ bụla metụrụ ha* ga-adị nsọ.’” 19  Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 20  “Ihe a bụ àjà Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-achụrụ Jehova n’ụbọchị a ga-ete ya mmanụ:+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka a na-achụ mgbe niile.+ A chụọ ọkara ya n’ụtụtụ, a chụọ ọkara ya ná mgbede. 21  A ga-agwa ya mmanụ ma mee ya n’ite dị mbadamba.+ Ị ga-eji mmanụ gwọọ ya nke ọma, nyawasịa ya iberibe iberibe ma weta ya ka ọ bụrụ àjà ọka, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 22  Ọ bụ onye nchụàjà e tere mmanụ, onye ga-anọchi ya n’ime ụmụ ya,+ ga-achụ ya. A ga-esuru ya Jehova ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ, ka ọ bụrụ àjà a na-esucha ọkụ. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide. 23  Àjà ọka ọ bụla bụ́ maka onye nchụàjà, a ga-esucha ya ọkụ. A gaghị eri ya eri.” 24  Jehova gwakwara Mosis okwu ọzọ, sị: 25  “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà mmehie:+ Ọ bụ n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ+ ka a ga-egbukwa anụ e ji achụ àjà mmehie n’ihu Jehova. Ọ bụ ihe kacha nsọ. 26  Onye nchụàjà nke chụrụ ya n’àjà maka mmehie ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya, n’ogige ụlọikwuu nzute.+ 27  “‘Ihe ọ bụla metụrụ anụ àjà ahụ ga-adị nsọ. Ọ bụrụkwa na mmadụ efesa ọbara anụ ahụ n’uwe ya, a ga-anọ n’ebe dị nsọ sụọ ya. 28  A ga-akụri ite ụrọ e ji sie ya. Ma ọ bụrụ ite ọla kọpa ka e ji sie ya, a ga-ekwocha ya ma jiri mmiri saa ya. 29  “‘Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 30  Ma, a gaghị eri anụ e ji achụ àjà mmehie ma ọ bụrụ na e webatara ọbara ya n’ụlọikwuu nzute ka e jiri ya kpuchie mmehie n’ebe nsọ.+ A ga-akpọ ya ọkụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “uwe ime.”
Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ahụ.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”