Ezikiel 26:1-21

  • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Taya (1-21)

    • “Ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ” (5, 14)

    • A wụnyere nkume na ájá n’ime osimiri (12)

26  N’abalị mbụ n’ọnwa, n’afọ nke iri na otu,* Jehova gwara m, sị:  “Nwa nke mmadụ, Taya sịrị Jeruselem,+ ‘Ntọọ! E tiwaala ọnụ ụzọ ámá obodo gị dị iche iche!+ Ugbu a, ihe ga na-agaziri m. M ga-aba ọgaranya ebe ọ bụ na a laala gị n’iyi.’  N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Taya, m ga-eme gị ihe. M ga-akpọta ọtụtụ mba ka ha lụso gị agha, otú ahụ ebili mmiri si eme n’oké osimiri.  Ha ga-ebibi mgbidi Taya, kwatuokwa ụlọ elu ya niile.+ M ga-ekpopụ ájá dị na ya, meekwa ka ọ bụrụ nkume elu ya na-akwọ mụrụmụrụ.  Ọ ga-adị ka ebe a na-agbasa ụgbụ n’oké osimiri ka ọ kọọ.’+ “‘Ọ bụ mụnwa kwuru ya, mba dị iche iche ga-ebukọrọkwa ihe dị n’ime ya. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.  A ga-eji mma agha gbuo ndị bi n’ime ime obodo ndị dị na Taya. Ndị mmadụ ga-amarakwa na m bụ Jehova.’  “Ọ bụ ya mere Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ji kwuo, sị: ‘M ga-esi n’ebe ugwu kpọta Nebukadneza* eze Babịlọn.+ Ọ bụ eze ndị eze.+ Ọ ga-eji ọtụtụ ịnyịnya,+ ụgbọ ịnyịnya agha,+ kpọrọkwa ndị agha na-agba ịnyịnya nakwa ọtụtụ ndị agha* bịa lụso Taya agha.  Ọ ga-eji mma agha bibie ndị bi n’ime ime obodo ndị dị na Taya. Ọ ga-arụkwa mgbidi siri ike nọchibido ya, jiri ájá rụọ mgbidi ga-agba mgbidi obodo ahụ gburugburu, burukwa nnukwu ọta bịa lụso ya agha.  Ọ ga-eji ihe e ji akwatu mgbidi kwatuo mgbidi Taya. Ọ ga-ejikwa anyụike* kwatuo ụlọ elu ya niile. 10  Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke na ha ga-eji uzuzu kpuchie Taya. Mgbe ọ ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ya na-abata, dị ka mgbe ìgwè mmadụ kwooro bata n’obodo a kwaturu mgbidi ya, mkpọtụ ndị agha ya na-agba ịnyịnya na nke ụkwụ ụgbọ ịnyịnya agha ga-eme ka mgbidi ya maa jijiji. 11  Ọbụ ụkwụ ịnyịnya ya ga-azọtọsị okporo ámá Taya niile.+ Ọ ga-eji mma agha gbuo ndị ya. Ogidi niile siri ike na Taya ga-adarukwa ala. 12  Ndị agha ga-akwakọrọkwa akụ̀ ya, bukọrọ ngwá ahịa ya,+ kwatuo mgbidi ya, kwatuokwa ụlọ ọma ya niile. Ha ga-awụnye nkume na osisi e ji rụọ ya nakwa ájá dị na ya n’ime osimiri.’ 13  “‘Taya, m ga-eme ka ị kwụsị abụ ị na-abụ, nke i ji na-eme mkpọtụ. A gaghịkwa anụ ụda ụbọ akwara gị ọzọ.+ 14  M ga-emekwa ka ị bụrụ nkume elu ya na-akwọ mụrụmụrụ. Ị ga-aghọkwa ebe a na-agbasa ụgbụ ka ọ kọọ.+ E nweghị ihe ga-eme ka a rụghachi gị, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, ekwuola ya.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 15  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara Taya, sị: ‘Ọ̀ bụ na agwaetiti dị iche iche agaghị ama jijiji ma ha nụ ụda ọdịda gị, nụ ka ndị nọ n’ọnụ ọnwụ* na-asụ ude, nụkwa na e gbuola ndị bi n’ime gị?+ 16  Ndị isi niile na-ahụ maka oké osimiri ga-esi n’ocheeze ha rịtuo ma yipụ uwe mwụda ha.* Ha ga-eyipụkwa uwe ha ndị a kpara ihe. Ha ga na-ama jijiji. Ha ga-anọdụ ọdụ n’ala nkịtị. Ha ga na-amakwa jijiji mgbe niile ma kporopụ anya na-ele gị.+ 17  Ha ga-abụkwa abụ iru uju+ gbasara gị ma sị gị: “Obodo ebe ndị si n’oké osimiri bịa bibu, obodo a na-aja mma, ị laala n’iyi.+ Gị na ndị bi n’ime gị siburu ike n’oké osimiri.+ Unu nọkwa na-emenye ndị niile bi n’ụwa ezigbo ụjọ. 18  Agwaetiti dị iche iche ga-ama jijiji n’ụbọchị ị ga-ada. Obi agaghị eru ndị bi n’agwaetiti niile dị n’oké osimiri ala n’ihi na e bibiela gị.”’+ 19  N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘M ga-ebibi gị, gị adị ka obodo mmadụ na-ebighị. M ga-eme ka mmiri na-amali elu kpuchie gị, meekwa ka oké osimiri kpuchie gị.+ 20  Otú ahụ m mere ka ndị ọzọ daa banye n’olulu* ka m ga-eme ka ị daa banye n’olulu ebe ndị nwụrụla kemgbe nọ. M ga-eme ka ị nọrọ n’ime ime ala, dị ka obodo ndị a lara n’iyi n’oge ochie. M ga-eme gị na ndị ọzọ niile na-abanye n’olulu ihe a,+ ka onye ọ bụla ghara ibi n’ime gị. M mechaa gị ihe a, m ga-eme ka ala ndị dị ndụ dị ebube.* 21  “‘M ga-eme ka ụjọ jide gị n’otu ntabi anya. Ị gaghịkwa adị ọzọ.+ Ha ga-achọ gị, ma e nweghị ihe ga-eme ka ha hụ gị.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọ ga-abụ afọ nke iri na otu a dọọrọ Eze Jehoyakim, Ezikiel, na ndị Juu ndị ọzọ n’agha.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “ìgwè mmadụ.”
Ma ọ bụ “mma agha.”
Na Hibru, “ndị e gburu egbu.”
Ma ọ bụ “uwe elu ha na-enweghị aka.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “m ga-achọ ala ndị dị ndụ mma.”