Ezra 10:1-44
10 Ka Ezra nọ na-ekpe ekpere+ ma na-ekwupụta mmehie ndị ya, na-ebe ákwá ma gbatịa onwe ya n’ala n’ihu ụlọ ezi Chineke, ọtụtụ ụmụ nwoke Izrel, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka zukọtara n’ìgwè n’ebe ọ nọ n’ihi na ha nọ na-ebesi ákwá ike.
2 Shekanaya nwa Jehayel,+ bụ́ otu n’ime ụmụ Ịlam,+ wee sị Ezra: “Anyị mehiere Chineke anyị mgbe anyị gara lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ ndị bi n’ala a.*+ N’agbanyeghị ya, olileanya ka dịịrị Izrel.
3 Ugbu a, ka anyị na Chineke anyị gbaa ndụ+ na anyị ga-achụla ụmụ nwaanyị niile ahụ na ụmụ ha mụtara, otú Jehova gwara anyị nakwa otú ndị ji iwu Chineke anyị kpọrọ ihe*+ gwara anyị. Ka anyị mee ihe Iwu* kwuru.
4 Bilie, n’ihi na ọ bụ gị ga-ahụ na e doziri okwu a, anyị kwụkwa gị n’azụ. Dị ike, meekwa ihe.”
5 Ezra wee bilie mee ka ndị isi ndị nchụàjà, ndị Livaị, na Izrel niile ṅụọ iyi na ha ga-eme ihe e kwuru.+ Ha wee ṅụọ iyi.
6 Ezra si n’ihu ụlọ ezi Chineke bilie ma gaa n’ọnụ ụlọ* Jehohenan nwa Elayashib, nke dị n’ụlọ nsọ ahụ. N’agbanyeghị na ọ gara n’ebe ahụ, o righị ihe ọ bụla, ọ ṅụghịkwa mmiri ọ bụla, n’ihi na ọ na-eru uju maka ihe ọjọọ ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere.+
7 Ha wee zisaa ozi na Juda niile nakwa na Jeruselem niile ka ndị niile si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta zukọta na Jeruselem,
8 nakwa na ndị isi na ndị okenye ekpebiela na onye ọ bụla na-abịaghị n’ime ụbọchị atọ, a ga-akwakọrọ* ngwongwo ya niile. A ga-achụpụkwa ya n’ọgbakọ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta.+
9 Ụmụ nwoke niile bụ́ ndị Juda na ndị Benjamin wee zukọta na Jeruselem n’ime ụbọchị atọ, ya bụ, n’ọnwa nke itoolu, n’abalị iri abụọ n’ọnwa ahụ. Ha niile nọ ọdụ na mbara èzí ụlọ ezi Chineke, na-ama jijiji n’ihi okwu ahụ a kpụ n’ọnụ nakwa n’ihi nnukwu mmiri na-ezonụ.
10 Ezra onye nchụàjà wee bilie sị ha: “Unu mere ihe ọjọọ mgbe unu gara lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ.+ Unu emeela ka mmehie ụmụ Izrel bukwuo ibu.
11 Ugbu a, kwupụtaranụ Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà mmehie unu, meekwanụ uche ya. Unu na ndị ala a na ụmụ nwaanyị mba ọzọ emekọzila ihe.”+
12 Ọgbakọ ahụ niile wee jiri oké olu kwuo, sị: “Anyị ga-eme ihe i kwuru.
13 Ma, ndị mehierenụ n’ime anyị dị ọtụtụ, ihe a bụkwa oge udu mmiri. Anyị agaghị eguzoli n’èzí. Okwu a agaghịkwa ebi n’otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ n’ihi na anyị emeela nnukwu mmehie.
14 N’ihi ya, biko, ka ndị isi anyị nọchite anya ọgbakọ a niile.+ Ka ndị niile nọ n’obodo anyị dị iche iche, bụ́ ndị lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ, bịa n’oge a kara aka, onye nke ọ bụla na ndị okenye na ndị ikpe obodo ya, ruo mgbe anyị mere ka iwe dị ọkụ Chineke anyị na-ewesa anyị n’ihi ihe a dajụọ.”
15 Ma, Jonatan nwa Asahel na Jazaya nwa Tikva ekwetaghị ka e mee ya otú ahụ. Ndị Livaị aha ha bụ Meshọlam na Shabetaị+ kwadokwara ha.
16 Ma ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta mere ihe ahụ e kpebiri. Ezra onye nchụàjà na ndị isi ọnụmara ha dị iche iche, bụ́ ndị niile aha ha dị n’akwụkwọ, zukọtara naanị ha n’abalị mbụ n’ọnwa nke iri ka ha leba anya n’okwu ahụ.
17 Mgbe ọ na-erula n’abalị mbụ n’ọnwa mbụ, ha elebachaala anya n’okwu ụmụ nwoke niile ahụ lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ.
18 A chọpụtara na ụfọdụ ụmụ ndị nchụàjà lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ:+ n’ime ụmụ Jeshụa+ nwa Jehozadak na ụmụnne ya, Measaya, Eliiza, Jerib, na Gedalaya.
19 Ma ha kwere nkwa na ha ga-achụla ndị nwunye ha. Ebe ọ bụ na ikpe mara ha, onye nke ọ bụla n’ime ha ga-eweta ebule maka mmehie ya.+
20 Ndị a bụ ndị ọzọ mere mmehie n’ime ndị nchụàjà: n’ime ụmụ Ịma,+ Hanenaị na Zebadaya;
21 n’ime ụmụ Herim,+ Measaya, Ịlaịja, Shemaya, Jehayel, na Ọzaya;
22 n’ime ụmụ Pash-họ,+ Elio-inaị, Measaya, Ishmel, Netanel, Jozabad na Eliesa.
23 N’ime ndị Livaị, Jozabad, Shimiaị, Kelaya (ya bụ, Kelaịta), Petahaya, Juda, na Eliiza;
24 n’ime ndị na-abụ abụ, Elayashib; n’ime ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, Shalọm, Tilem, na Yuraị.
25 Ndị a bụ ndị mere mmehie n’ime ndị Izrel: n’ime ụmụ Perọsh,+ Ramaya, Izaya, Malkaịja, Mijamin, Elieza, Malkaịja, na Benaya;
26 n’ime ụmụ Ịlam,+ Matanaya, Zekaraya, Jehayel,+ Abdaị, Jeremọt, na Ịlaịja;
27 n’ime ụmụ Zatu,+ Elio-inaị, Elayashib, Matanaya, Jeremọt, Zebad, na Azaịza;
28 n’ime ụmụ Bibaị,+ Jehohenan, Hananaya, Zabaị, na Atlaị;
29 n’ime ụmụ Benaị, Meshọlam, Malọk, Adaya, Jeshọb, Shiel, na Jeremọt;
30 n’ime ụmụ Pehat-moab,+ Adna, Kilal, Benaya, Measaya, Matanaya, Bezalel, Binuaị, na Manase;
31 n’ime ụmụ Herim,+ Eliiza, Ishaịja, Malkaịja,+ Shemaya, Shimiọn,
32 Benjamin, Malọk, na Shemaraya;
33 n’ime ụmụ Heshọm,+ Matinaị, Matata, Zebad, Elifelet, Jeremaị, Manase, na Shimiaị;
34 n’ime ụmụ Benaị, Meadaị, Amram, Yuel,
35 Benaya, Bedaya, Keluhaị,
36 Vanaya, Meremọt, Elayashib,
37 Matanaya, Matinaị, na Jeasu;
38 n’ime ụmụ Binuaị, Shimiaị,
39 Shelemaya, Netan, Adaya,
40 Maknadebaị, Sheshaị, Sheraị,
41 Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
42 Shalọm, Amaraya, na Josef;
43 n’ime ụmụ Nibo, Jeayel, Matitaya, Zebad, Zebaịna, Jadaị, Joel, na Benaya.
44 Ndị a niile lụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ.+ Ha chụlara ndị nwunye ha ahụ na ụmụ ha mụtaara ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “kpọbatara ụmụ nwaanyị mba ọzọ ndị bi n’ala a n’ụlọ anyị.”
^ Na Hibru, “ndị na-ama jijiji n’ihi iwu Chineke.”
^ Ya bụ, Iwu Mosis.
^ Ma ọ bụ “n’ebe a na-eri ihe.”
^ Ma ọ bụ “ga-ejichi.”