Hosia 4:1-19
4 Ndị Izrel, nụrụnụ okwu Jehova,N’ihi na Jehova na ndị bi n’ala a nwere okwu,+Maka na eziokwu na ịhụnanya* adịghị n’ala a, ha amaghịkwa Chineke.+
2 Ihe juru ebe niile bụ ịgha ụgha,+ igbu mmadụ,*+Ịṅụ iyi ụgha, izu ohi, na ịkwa iko.+
A na-egbu ndị mmadụ* n’akwụsịghị akwụsị.+
3 Ọ bụ ya mere ala a ga-eji ruo uju.+
Onye ọ bụla bi na ya ga-atụbọkwa.
Anụ ọhịa niile na nnụnụ niile ga-anwụ.
Azụ̀ niile ga-anwụkwa.
4 “Ma, ka onye ọ bụla ghara ịgba mgba, ma ọ bụ baa mba,+N’ihi na ndị gị dị ka ndị na-agbaso onye nchụàjà mgba.+
5 N’ihi ya, ị ga-adagharị n’ehihie.
Onye amụma ga-esokwa gị dagharịa dị ka à ga-asị na ọ bụ n’abalị.
M ga-alakwa nne gị n’iyi.
6 Ndị m ga-ala n’iyi, n’ihi na ha amaghị m.
Ebe ọ bụ na unu achọghị ịma m,+Achọghịkwa m ka unu bụrụ ndị nchụàjà m.
Ebe ọ bụ na unu echefuola iwu m,*+M ga-echefukwa ụmụ unu.
7 Ka ha na-ehikwu nne, ka ha na-enupụrụ m isi.+
Kama ime ka a na-akwanyere ha ùgwù, m ga-emenye ha ihere.*
8 Mmehie ndị m* ka ha ji eriju afọ.
Ha na-achọsikwa ike* ka ndị m mehie.
9 Otú ọ ga-adịrị ndị nkịtị ka ọ ga-adịrị onye nchụàjà.
M ga-eme ka ha zaa ajụjụ maka ihe ha metara.
M ga-emekwa ka ha buru ihe ha metara.+
10 Ha ga-eri ihe, ma afọ agaghị eju ha.+
Ha na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ga na-akwa iko,* ma ha agaghị amụba,+N’ihi na o nweghị ihe ha ji Jehova kpọrọ.
11 Ịgba akwụna* na mmanya ochie na mmanya ọhụrụNa-eme ka ime ihe dị mma ghara ịna-agụ ha agụụ.*+
12 Ndị m na-ajụ arụsị ha e ji osisi pịa ase,Ha na-emekwa ihe mkpara ha* na-agwa ha,N’ihi na obi ha nke dị n’ịgba akwụna* emeela ka ha kpafuo.
Akwụna ha na-agba* emeekwala ka ha jụ ịnọ n’okpuru Chineke ha.
13 Ha na-achụ àjà n’elu ugwu ukwu.+
Ha na-achụkwa àjà n’elu ugwu nta dị iche icheNakwa n’okpuru osisi ook na osisi stọraks na osisi ukwu ọ bụla,+N’ihi na ndò ha dị mma.
Ọ bụ ya mere ụmụ unu ndị nwaanyị ji agba akwụna,*Ndị nwunye ụmụ unu ana-akwakwa iko.
14 “Agaghị m eme ka ụmụ unu ndị nwaanyị zaa ajụjụ maka akwụna ha na-agba.*
Agaghịkwa m eme ka ndị nwunye ụmụ unu zaa ajụjụ maka iko ha na-akwa,N’ihi na ụmụ nwoke na-akpọrọ ndị akwụna gaa nọrọ iche.
Ọ bụkwa ha na ndị akwụna* na-achụ àjà.
A ga-ebibi ụdị ndị a na-amaghị ihe.+
15 Izrel, ị na-agba akwụna.*+
Juda, emekwala ka ya.+
Unu abịakwala na Gilgal+ ma ọ bụ na Bet-even.+
Unu aṅụkwala iyi, sị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi!’+
16 N’ihi na Izrel na-eme isi ike dị ka ehi nke na-eme isi ike.+
Jehova ọ̀ ga-azụ ha ugbu a dị ka nwa ebule nọ ebe ọ na-ata ahịhịa?*
17 Ifrem enyefeela arụsị dị iche iche onwe ya.+
Hapụ ya.
18 Mgbe mmanya* ya gwụrụ,Ya na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-akwa iko.*
Ihe ihere na-atọgbu ndị na-achị* ya atọgbu.+
19 Ifufe ga-eji nku ya bufuo ya.
Àjà ha dị iche iche ga-emekwa ha ihere.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
^ Na Hibru, “A na-awụfu ọbara.”
^ Ma ọ bụ “ihe m kụziiri unu.”
^ O nwere ike ịbụ, “Kama ito m, ha na-akparị m.”
^ Ya bụ, ihe ndị m wetara ka e jiri chụọ àjà maka mmehie ha.
^ Ma ọ bụ “Ọ na-agụsikwa mkpụrụ obi ha agụụ ike.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mkpụrụ obi.”
^ Ma ọ bụ “Ha na ndị akwụna ga na-akwa iko.”
^ Na Hibru, “Na-anapụ ha obi.”
^ Ma ọ bụ “Ịkwa iko.”
^ Ma ọ bụ “mkpara ha ji efe arụsị.”
^ Ma ọ bụ “n’ịkwa iko.”
^ Ma ọ bụ “Iko ha na-akwa.”
^ Ma ọ bụ “akwa iko.”
^ Ma ọ bụ “iko ha na-akwa.”
^ Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.
^ Ma ọ bụ “ị na-akwa iko.”
^ Na Hibru, “n’ebe sara mbara.”
^ Ma ọ bụ “mmanya ọka wit.”
^ Ma ọ bụ “Ya na ndị akwụna kwara iko.”
^ Ma ọ bụ “na-echebe.”