Ilu 2:1-22

  • Uru amamihe bara (1-22)

    • Chọọ amamihe otú e si achọ akụ̀ zoro ezo (4)

    • Ichebara ihe echiche nke ọma na-echebe mmadụ (11)

    • Ịkwa iko na-akpata nsogbu (16-19)

2  Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwuMa jiri iwu m na-enye gị kpọrọ ihe,+   I wee gee ntị ka ị mara ihe+Ma meghee obi gị ka ị na-aghọta ihe;+   Ọ bụrụkwa na ị rịọ arịrịọ ka ị ghọta ihe+Ma rịọsie arịrịọ ike ka ihe wee doo gị anya;+   Ọ bụrụ na ị na-achọ ya otú e si achọ ọlaọcha,+Na-achọkwa ya otú e si achọ akụ̀ zoro ezo;+   Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe ịtụ egwu Jehova pụtara,+Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.+   N’ihi na ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe.+ Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.   Ọ na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe. Ọ bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta.+   Ọ na-eche ụzọ ndị na-ekpe ikpe ziri ezi nche,Ọ ga-echekwa ụzọ ndị na-erubere ya isi nche.+   Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ,Ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.+ 10  Mgbe amamihe banyere gị n’obi,+Ịmụta ihe ana-atọkwa gị* ụtọ,+ 11  Ichebara ihe echiche nke ọma ga-eche gị nche,+Ịghọta ihe ga-echebekwa gị. 12  Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịbanye n’ụzọ ọjọọ,Ka ị ghara ịdaba n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+ 13  Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị na-ahapụ ezigbo ụzọGawa n’ụzọ gbara ọchịchịrị,+ 14  Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị ime ihe ọjọọ na-atọ ụtọ,Ndị ịrụ arụrụala na-eme obi ụtọ, 15  Ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ,Ndị na-aghọkwa aghụghọ n’ihe niile ha na-eme. 16  Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*N’aka nwaanyị na-akwa iko* nke na-eji ire ụtọ arata mmadụ,+ 17  Bụ́ nwaanyị na-ahapụ enyi ọma* o nwere kemgbe ọ bụ agbọghọ,+Na-echefukwa ndụ ya na Chineke gbara. 18  N’ihi na ịga n’ụlọ ya dị ka mmadụ ịgakwuru ọnwụ,Ụzọ ụlọ ya na-edugakwa mmadụ n’ili.+ 19  E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọta,Ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ na-eduga ná ndụ.+ 20  N’ihi ya, soro ụzọ ndị ezigbo mmadụ,Nọrọkwa n’ụzọ ndị ezi omume.+ 21  N’ihi na ọ bụ naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa,Ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta* ga-anọ na ya.+ 22  Ma a ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa,+A ga-ebibikwa ndị aghụghọ nọ na ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “mkpụrụ obi gị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “nwaanyị bịara abịa.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.
Na Hibru, “nwaanyị mba ọzọ.” Ọ bụ nwaanyị na-ebi ndụ na-adịghị Chineke mma.
Ma ọ bụ “di.”
Ma ọ bụ “ndị kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ.”