Ilu 29:1-27

  • Nwa na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere (15)

  • N’ebe a na-enweghị ọhụụ, ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha (18)

  • Onye na-ewe iwe na-eme ka e sewe okwu (22)

  • A na-akwanyere onye dị umeala n’obi ùgwù (23)

  • Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà (25)

29  Onye a dọrọ aka ná ntị ugboro ugboro ma ya agbaa isi akwara,+A ga-ala ya n’iyi kpamkpam na mberede.+   Mgbe ndị ezi omume dị ọtụtụ, ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ,Ma mgbe onye ajọ omume na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.+   Onye ji amamihe kpọrọ ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+Ma onye ya na ndị akwụna na-akpa na-ala akụ̀ ya n’iyi.+   Ọ bụrụ na eze na-ekpe ikpe ziri ezi, ihe na-adị mma n’obodo,+Ma onye na-achọ ka e nye ya aka azụ na-ala obodo n’iyi.   Onye na-eto onye agbata obi ya otuto elu ọnụNa-agbasara ya ụgbụ ka ọ zọnye ụkwụ.+   Mmehie onye ajọ omume ga-eme ka ọ ma n’ọnyà,+Ma onye ezi omume na-eti mkpu ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ.+   Onye ezi omume na-achọ ka e meere ndị ogbenye ihe ruuru ha,+Ma onye ajọ omume achọghịdị ịma gbasara ha.+   Ndị na-etu ọnụ na-amụnye obodo ọkụ,+Ma ndị ma ihe na-eme ka iwe dajụọ.+   Ọ bụrụ na onye ma ihe ekwe ka ya na onye iberiibe rụwa ụka,Mba na ịkwa emo ga-arị ibe ha elu, ma onye ahụ ma ihe agaghị ezu ike.+ 10  Ndị na-egbu mmadụ na-akpọ onye ọ bụla aka ya dị ọcha asị,+Ha na-achọkwa ka ha gbuo ndị ezi omume.* 11  Onye nzuzu na-ewe iwe ruo n’isi,*+Ma onye ma ihe na-ejide onwe ya.+ 12  Ọ bụrụ na onye ọchịchị na-ege okwu ụgha,Ndị niile na-ejere ya ozi ga-abụ ndị ajọ omume.+ 13  Ihe jikọrọ ogbenye na onye na-emegbu ya bụ naỌ bụ Jehova nyere ha abụọ ndụ.* 14  Mgbe eze na-ekpe ndị ogbenye ikpe ziri ezi,+Ọchịchị ya agaghị enwe nsogbu ọ bụla.+ 15  Ụtarị* na mba na-eme ka mmadụ mara ihe,+Ma nwatakịrị a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere. 16  Mgbe ndị ajọ omume dị ọtụtụ, mmehie na-adị ọtụtụ,Ma ndị ezi omume ga-ahụ ka ndị ajọ omume na-ada.+ 17  Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala. Ọ ga-emekwa ka i* nwee ezigbo obi ụtọ.+ 18  N’ebe a na-enweghị ndị amụma na-ahụ ọhụụ,* ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha.+ Ma ndị na-edebe iwu na-enwe obi ụtọ.+ 19  Onye na-eje ozi agaghị anabata okwu a gwara ya mgbe a na-adọ ya aka ná ntị. N’agbanyeghị na ọ na-aghọta ihe a gwara ya, ọ naghị erube isi.+ 20  Ọ dị mfe inyere onye nzuzu aka+Karịa inyere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche aka.+ 21  Ọ bụrụ na mmadụ esi n’oge onye na-ejere ya ozi bụ nwata zụtọọ ya,E mechaa, onye na-ejere ya ozi agaghị eji ya kpọrọ ihe. 22  Onye na-ewekarị iwe na-eme ka e sewe okwu.+ Onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.+ 23  Onye dị mpako ga-ada,+Ma a ga-akwanyere onye ọ bụla dị umeala n’obi ùgwù.+ 24  Onye na-enyere onye ohi aka kpọrọ onwe* ya asị. O nwere ike ịnụ òkù a kpọrọ ya ka ọ bịa gbaa akaebe,* ma e nweghị ihe ọ ga-ekwu.+ 25  Ịtụ mmadụ egwu na-eme ka mmadụ ma n’ọnyà,+Ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.+ 26  Ọtụtụ ndị na-achọ ka ha hụ onye ọchịchị,*Ma ọ bụ Jehova na-eme ka e kpee mmadụ ikpe ziri ezi.+ 27  Ndị ezi omume kpọrọ onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ asị,+Ma onye ajọ omume kpọrọ onye na-eme ihe ziri ezi asị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “Ma onye ezi omume na-agbalị ka o chebe ya ndụ.”
Ma ọ bụ “na-egosicha otú obi dị ya.”
Na Hibru, “na-eme ka anya ha abụọ na-ahụ ìhè.”
Ma ọ bụ “Ịdọ aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “a na-enweghị ọhụụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ịnụ ọnụ a bụrụ.”
O nwere ike ịbụ, “na-achọ ka ha na onye ọchịchị dị ná mma.” Na Hibru, “na-achọ ihu onye ọchịchị.”