Jenesis 36:1-43

  • Ụmụ Ịsọ (1-30)

  • Ndị eze Ịdọm na ndị bụ́ ndị isi na ya (31-43)

36  Ihe a bụ akụkọ ndụ Ịsọ, ya bụ, Ịdọm.+  Ịsọ lụrụ ụmụ nwaanyị ndị Kenan. Ha bụ: Eda+ nwa Ịlọn onye Het,+ Oholibema+ nwa Ena, nwa nwa Zibiọn onye Haịvaịt,  nakwa Basemat,+ nwa Ishmel. Basemat bụ nwanne nwaanyị Nebeyọt.+  Eda mụụrụ Ịsọ Elifaz, Basemat amụọ Ruel,  Oholibema amụọ Jiọsh, Jelam, na Kora.+ Ọ bụ ha bụ ụmụ Ịsọ ndị nwoke, ndị a mụụrụ ya na Kenan.  Mgbe e mechara, Ịsọ kpọọrọ ndị nwunye ya, ụmụ ya ndị nwoke, ụmụ ya ndị nwaanyị, na ndị niile nọ n’ụlọ ya, chịrị ehi ya na anụ ya niile ndị ọzọ, burukwa akụnụba niile ọ kpatara+ na Kenan gaa n’ala ọzọ nke dịtụ anya n’ebe Jekọb nwanne ya bi.+  Ọ kwapụrụ maka na akụnụba ha ehiela nne nke ukwuu nke na ha enweghị ike ibikọta otu ebe, ala ebe ha bi* enweghịkwa ike ịba ha n’ihi ìgwè anụ ha.  Ịsọ wee biri n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu.+ Ọ bụ Ịsọ bụ Ịdọm.+  Ihe a bụ akụkọ ndụ Ịsọ, nna ndị Ịdọm, ndị bi n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu.+ 10  Ihe a bụ aha ụmụ Ịsọ ndị nwoke: Elifaz nwa Eda nwunye Ịsọ; Ruel nwa Basemat nwunye Ịsọ.+ 11  Ụmụ Elifaz ndị nwoke bụ Timan,+ Oma, Zifo, Getam, na Kinaz.+ 12  Elifaz, nwa Ịsọ, nwere iko nwaanyị aha ya bụ Timna. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Elifaz Amalek.+ Ọ bụ ha bụ ụmụ* Eda, nwunye Ịsọ. 13  Ndị a bụ ụmụ Ruel ndị nwoke: Nehat, Zira, Shama, na Miza. Ọ bụ ha bụ ụmụ* Basemat,+ nwunye Ịsọ. 14  Ndị a bụ ụmụ nwoke Oholibema nwunye Ịsọ mụụrụ Ịsọ: Jiọsh, Jelam, na Kora. Oholibema bụ nwa Ena, bụrụkwa nwa nwa Zibiọn. 15  Ndị a bụ ndị isi n’ime ụmụ Ịsọ ndị nwoke:+ Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Elifaz, ọkpara Ịsọ, mụrụ: Timan, Oma, Zifo, Kinaz,+ 16  Kora, Getam, na Amalek. Ọ bụ ha bụ ndị isi n’ụmụ Elifaz+ n’ala Ịdọm. Ha bụ ụmụ* Eda. 17  Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Ruel, nwa Ịsọ, mụrụ: Nehat, Zira, Shama, na Miza. Ọ bụ ha bụ ndị isi n’ụmụ Ruel n’ala Ịdọm.+ Ha bụ ụmụ* Basemat, nwunye Ịsọ. 18  Ụmụ nwoke ndị a bụ ndị isi Oholibema, nwunye Ịsọ, mụrụ: Jiọsh, Jelam, na Kora. Ọ bụ ha bụ ndị isi Oholibema, nwunye Ịsọ, mụrụ. Oholibema bụ nwa Ena. 19  Ọ bụ ndị a bụ ndị ezinụlọ Ịsọ, ọ bụkwa ndị a bụ ndị isi ha. Ọ bụ Ịsọ bụ Ịdọm.+ 20  Ndị a bụ ụmụ nwoke Sia onye Horaịt mụrụ, bụ́ ndị nwe ala ahụ:+ Lotan, Shobal, Zibiọn, Ena,+ 21  Daịshọn, Iza, na Daịshan.+ Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị Horaịt, ụmụ Sia, n’ala Ịdọm. 22  Ụmụ nwoke ndị Lotan mụrụ bụ Horaị na Himam. Nwanne nwaanyị Lotan bụ Timna.+ 23  Ndị a bụ ụmụ nwoke Shobal mụrụ: Alvan, Manahat, Ịbal, Shifo, na Onam. 24  Ndị a bụ ụmụ nwoke Zibiọn mụrụ:+ Eya na Ena. Ọ bụ Ena a hụrụ mmiri na-ekpo ọkụ n’ala ịkpa mgbe ọ na-elekọtara Zibiọn nna ya jakị. 25  Ndị a bụ ụmụ Ena: Daịshọn na Oholibema. Oholibema bụ nwa Ena. 26  Ndị a bụ ụmụ nwoke Daịshọn mụrụ: Hemdan, Eshban, Itran, na Kiran.+ 27  Ndị a bụ ụmụ nwoke Iza mụrụ: Bilhan, Zeavan, na Ekan. 28  Ndị a bụ ụmụ nwoke Daịshan mụrụ: Ọz na Eran.+ 29  Ndị a bụ ndị isi ndị Horaịt: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ena, 30  Daịshọn, Iza, na Daịshan.+ Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị Horaịt n’ala Sia. 31  Ndị a bụ ndị eze chịrị ndị Ịdọm+ tupu eze ọ bụla achịa ndị Izrel.+ 32  Bila nwa Biọ chịrị n’Ịdọm. Aha obodo ya bụ Dinhaba. 33  Mgbe Bila nwụrụ, Jobab nwa Zira, onye Bọzra, nọchiri ya malite ịchị. 34  Mgbe Jobab nwụrụ, Husham onye Timan, nọchiri ya malite ịchị. 35  Mgbe Husham nwụrụ, Hedad nwa Bidad, onye meriri ndị Midian+ n’ala Moab, nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Evit. 36  Mgbe Hedad nwụrụ, Samla onye Masrika nọchiri ya malite ịchị. 37  Mgbe Samla nwụrụ, Sheọl onye Rehobọt, nọchiri ya malite ịchị. Rehobọt a dị n’akụkụ osimiri. 38  Mgbe Sheọl nwụrụ, Bel-henan nwa Akbọ nọchiri ya malite ịchị. 39  Mgbe Bel-henan nwa Akbọ nwụrụ, Heda nọchiri ya malite ịchị. Aha obodo ya bụ Peyu. Aha nwunye ya bụ Mehetabel. Mehetabel bụ nwa Metred, Metred abụrụ nwa Mizahab. 40  Ndị a bụ ndị isi Ịsọ mụrụ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’obodo n’obodo, n’aha n’aha: Timna, Alva, Jitet,+ 41  Oholibema, Ila, Paịnọn, 42  Kinaz, Timan, Mibza, 43  Magdiel, na Aịram. Ọ bụ ha bụ ndị isi Ịdọm, ọ bụkwa n’ebe ndị a ka ha biri n’ala ha. Ọ bụ onye a bụ Ịsọ,+ nna ndị Ịdọm.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ala ebe ha bụ ndị mbịarambịa.”
Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”
Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”
Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”
Ma ọ bụ “ụmụ ụmụ.”