Jenesis 5:1-32

  • Malite n’oge Adam ruo n’oge Noa (1-32)

    • Adam mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị (4)

    • Ịnọk so Chineke na-eje ije (21-24)

5  Ihe a bụ akwụkwọ kọrọ akụkọ Adam. N’ụbọchị Chineke kere Adam, o kere ya ka ọ dị ka ya.+  Chineke kere ha nwoke na nwaanyị.+ N’ụbọchị o kere ha,+ ọ gọziri ha ma kpọọ ha Mmadụ.*  Adam nọrọ ndụ otu narị afọ na iri atọ (130), o wee mụọ nwa nwoke yiri ya, onye dị ka ya. Ọ gụrụ ya Set.+  Mgbe Adam mụchara Set, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.  Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri atọ (930), o wee nwụọ.+  Set nọrọ ndụ otu narị afọ na ise (105), o wee mụọ Ịnọsh.+  Mgbe Set mụchara Ịnọsh, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na asaa (807). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.  Ụbọchị niile Set dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri na abụọ (912), o wee nwụọ.  Ịnọsh nọrọ ndụ afọ iri itoolu, o wee mụọ Kinan. 10  Mgbe Ịnọsh mụchara Kinan, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri na ise (815). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 11  Ụbọchị niile Ịnọsh dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na ise (905), o wee nwụọ. 12  Kinan nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Mahalalel.+ 13  Mgbe Kinan mụchara Mahalalel, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri anọ (840). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 14  Ụbọchị niile Kinan dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri (910), o wee nwụọ. 15  Mahalalel nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Jered.+ 16  Mgbe Mahalalel mụchara Jered, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri atọ (830). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 17  Ụbọchị niile Mahalalel dịrị ndụ bụ narị afọ asatọ na iri itoolu na ise (895), o wee nwụọ. 18  Jered nọrọ ndụ otu narị afọ na iri isii na abụọ (162), o wee mụọ Ịnọk.+ 19  Mgbe Jered mụchara Ịnọk, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 20  Ụbọchị niile Jered dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na abụọ (962), o wee nwụọ. 21  Ịnọk nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Metusela.+ 22  Mgbe Ịnọk mụchara Metusela, o so ezi Chineke* na-eje ije ruo narị afọ atọ (300). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 23  Ụbọchị niile Ịnọk dịrị ndụ bụ narị afọ atọ na iri isii na ise (365). 24  Ịnọk so ezi Chineke na-eje ije.+ E mechaa, a hụghịzi ya, n’ihi na Chineke kpọpụrụ ya.+ 25  Metusela nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na asaa (187), o wee mụọ Lemek.+ 26  Mgbe Metusela mụchara Lemek, ọ nọrọ ndụ narị afọ asaa na iri asatọ na abụọ (782). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 27  Ụbọchị niile Metusela dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na itoolu (969), o wee nwụọ. 28  Lemek nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na abụọ (182), o wee mụọ nwa nwoke. 29  Ọ gụrụ ya Noa,*+ sị: “Onye a ga-eme ka anyị zuo ike* n’ọrụ ike anyị na-arụ nakwa n’ọrụ anyị na-arụgbu onwe anyị maka na Jehova bụrụ ala ọnụ.”+ 30  Mgbe Lemek mụchara Noa, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise na iri itoolu na ise (595). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 31  Ụbọchị niile Lemek dịrị ndụ bụ narị afọ asaa na iri asaa na asaa (777), o wee nwụọ. 32  Mgbe Noa ruru narị afọ ise (500), ọ malitere ịmụ ụmụ. Aha ha bụ Shem,+ Ham,+ na Jefet.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Adam.”
Na Hibru, “Chineke ahụ.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ na Noa pụtara “Ezumike; Nkasi Obi.”
Ma ọ bụ “ga-akasi anyị obi.”