Jeremaya 48:1-47
-
E buru amụma ihe ga-eme ndị Moab (1-47)
48 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere Moab,+ sị:
“Nibo+ ga-ata ahụhụ, n’ihi na e bibiela ya.
E wegharala Kiriateyim,+ menyekwa ndị bi na ya ihere.
E menyela ndị bi n’ebe a rụsiri ike ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha.+
2 Ndị mmadụ anaghịzi eto Moab.
Ndị iro nọ na Heshbọn+ kpaa nkata otú ha ga-esi bibie ya, na-asị:
‘Bịanụ ka anyị laa ya n’iyi ka ọ gharazie ịbụ mba.’
“Gịnwa kwa, Madmen, mechie ọnụ,N’ihi na mma agha na-eso gị n’azụ.
3 Mkpu ákwá na-ada na Họroneyim,+N’ihi otú e si na-ebibi ya ma na-ala ya n’iyi.
4 E bibiela Moab.
Ụmụntakịrị ndị nọ na ya na-eti mkpu ákwá.
5 Ndị mmadụ beere ákwá na-agbago ụzọ e si aga Luhit.
Ka ha sikwa Họroneyim na-agbada, ha nụrụ ka ndị mmadụ na-ebe ákwá n’ihi mkpamkpa ahụ kparanụ.+
6 Gbaanụ ọsọ. Gbapụnụ maka ndụ* unu.
Unu ga-adịkwa ka osisi junipa dị n’ala ịkpa.
7 Ndị Moab, ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ọrụ unu na akụ̀ unu obi,A ga-eweghara obodo unu.
A ga-adọrọkwa Kimọsh+Na ndị nchụàjà ya na ndị isi ndị na-efe ya n’agha.
8 Onye na-ebibi ihe ga-abịa n’obodo gị niile.
E nweghị obodo nke ọ ga-ahapụ.+
Ndagwurugwu ga-ala n’iyi.
A ga-alakwa ala dị larịị n’iyi otú Jehova kwuru.
9 Meerenụ Moab ihe e ji ahụwa ụzọ ama,N’ihi na ọ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi, ndị bi na ya agbapụchaa,Obodo ya dị iche iche abụrụ ihe na-awụ akpata oyi,N’enweghị onye bi na ha.+
10 Ọ bụrụ na e nwee onye na-ejighị ozi ọ na-ejere Jehova kpọrọ ihe, a ga-abụ ya ọnụ.
Ọ bụrụkwa na e nwee onye na-achọghị iji mma agha ya gbuo mmadụ,* a ga-abụ ya ọnụ.
11 Ndị Moab tụsaara ahụ́ kemgbe ha bụ ụmụaka.
Ha nọ jii ka ikè mmanya.
E sitụbeghị n’otu ite wụnye ha n’ite ọzọ.
A dọrọtụbeghịkwa ha n’agha.
Ọ bụ ya mere ha ka ji atọ otú ha na-atọ kemgbe.
Ísìsì ha agbanwebeghịkwa.
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe m ga-eziga ndị ga-awụfu ha. Ha ga-awụfu ha na ihe niile dị n’ite ha. Ha ga-akụrikwa nnukwu ite ha niile.
13 Ihere Kimọsh bụ́ chi ndị Moab ga-eme ha, otú ahụ ihere mechara mewe ndị Izrel maka na ha tụkwasịrị arụsị dị na Betel obi.+
14 Olee ihe mere unu ji sị: “Anyị bụ ndị dike n’agha, anyị dịkwa njikere ịlụ agha”?’+
15 Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,‘E bibiela Moab.+
A lụsola obodo ya dị iche iche agha.+
E gbuokwala ụmụ okorobịa ha ndị kacha mma.’+
16 Ọdachi ga-adakwasị ndị Moab n’oge na-adịghị anya.
Oge a ga-ebibi ha dị ezigbo nso.+
17 Ndị niile gbara ha gburugburuNa ndị niile ma ụdị ndị ha bụ* ga-emetara ha ebere.
Gwanụ ha, sị: ‘A gbajiela mkpanaka siri ike, ya bụ, mkpara mara mma.’
18 Ndị bi na Daịbọn, hapụnụ ọkwá unu dị ebube.
Nọdụnụ ala ka akpịrị kpọọ unu nkụ,*+N’ihi na onye bibiri Moab abịala ịlụso unu agha.
Ọ ga-alakwa ebe unu niile a rụsiri ike n’iyi.+
19 Ndị bi n’Aroa,+ guzoronụ n’akụkụ ụzọ lewe ihe na-eme.
Jụọnụ nwoke na-agba ọsọ na nwaanyị na-agbapụ agbapụ ihe na-eme.
20 E menyere ndị Moab ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha.
Beenụ ákwá, tiekwanụ mkpu ákwá.
Kọọnụ n’Anọn+ na e bibiela Moab.
21 “Chineke ekpeela ndị bi n’ala dị larịị ikpe,+ ya bụ, Holọn, Jehaz,+ Mefat,+
22 Daịbọn,+ Nibo,+ Bet-diblateyim,
23 Kiriateyim,+ Bet-gemọl, Bet-mion+
24 Kiriọt,+ Bọzra, na obodo niile dị na Moab, ma ndị dị nso ma ndị dị anya.
25 Jehova kwuru, sị, ‘A napụla Moab ike ya.*
A gbajiekwala aka ya dị ike.
26 Meenụ ka ọ ṅụọ mmanya ṅụrọọ anya,+ n’ihi na o buliela onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+
Moab atụrụọla onwe ya n’agbọ ọ gbọrọ.
A na-achịzi ya ọchị.
27 Ọ̀ kwa ị nọ na-akwa Izrel emo?+
Ị̀ hụrụ ya ebe ya na ndị ohi nọ,Nke mere i ji na-efufe isi ma na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ya?
28 Ndị bi na Moab, hapụnụ obodo unu gaa biri ná nnukwu nkume,Dịrịkwanụ ka nduru nke na-akpa akwụ́ n’akụkụ ndagwurugwu.’”
29 “Anyị anụla banyere nganga Moab, na ọ dị ezigbo mpako.
Anyị anụla na ọ na-ebuli onwe ya elu, na-akpa nganga, na-aka anya, onwe ya na-ebukwa ya isi.”+
30 “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m na ọ na-ewe oké iwe.
Ma, ọnụ ọ na-etu abaghị uru ọ bụla.
E nweghị ihe ndị Moab ga-emeli.
31 Ọ bụ ya mere m ga-eji beere Moab ákwá arịrị.
M ga-ebekwara Moab niile ákwá,Beekwara ndị Kia-hires ákwá.+
32 Osisi vaịn Sibma,+ m ga-ebere gị ákwáKarịrị nke e beere Jeza.+
Alaka gị ndị na-awasa nke ọma awasaala gafee oké osimiri.
Ha awasaala ruo n’oké osimiri, ruokwa Jeza.
Onye na-ebibi ihe abịalaIbibi mkpụrụ mịịrị gị n’ọkọchị nakwa mkpụrụ vaịn ị ghọtara.+
33 E meela ka a gharazie ịna-enwe obi ụtọ na ọṅụ n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche icheNakwa n’ala Moab.+
Emeela m ka mmanya kwụsị ịna-agbapụta n’ebe a na-azọchapụta mmanya.
O nweghị onye ga na-eti mkpu ọṅụ ka ọ na-azọcha mkpụrụ.
Mkpu a ga na-eti agaghị abụ mkpu ọṅụ.’”+
34 “‘Ha na-eti mkpu ákwá na Heshbọn,+ a na-anụ ya n’Iliele.+
Ha na-etikwa ya, a na-anụ ya na Jehaz.+
Ha na-etikwa mkpu ákwá na Zoa, a na-anụ ya na Họroneyim,+ na-anụkwa ya n’Eglat-shelaịshiya.
Mmiri Nimrim ga-atakwa kpamkpam.+
35 M ga-eme ka a gharazie inwe onye na-eweta onyinye n’ebe dị eluNakwa onye na-achụrụ chi ya àjà na Moab.’
Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
36 ‘Ọ bụ ya mere obi m ga-eji na-eme mkpọtụ ka ọjà* n’ihi Moab.+
Obi m ga na-adakwa ka ọjà* n’ihi ndị Kia-hires.
Ọ bụ ya mere akụnụba ya ga-eji laa n’iyi.
37 N’ihi na isi ha niile akwọchaala.+
A kpụkwara afụ ọnụ ha niile akpụ.
Aka ha niile bucha ọnyá.+
Ha kekwara ákwà iru uju n’úkwù.’”+
38 “Jehova kwuru, sị, ‘A nọ n’elu ụlọ niile dị na MoabNakwa n’ámá ya niile
Na-eti sọ mkpu ákwá.
N’ihi na akụọla m Moab righirighiKa ite na-abaghị uru.
39 Ụjọ ejidela ya. Tienụ mkpu ákwá.
Moab agbaala ọsọ. Ihere na-emezi ya.
A na-achịzi ya ọchị.
Otú ọ dịzi na-emenyekwa ndị niile gbara ya gburugburu ụjọ.’”
40 “Jehova kwuru, sị:
‘Otú ahụ ugo si efedata ka o buru ihe,+Ka onye iro ga-agbasa nku ya ka o buru Moab.+
41 A ga-eweghara obodo niile dị na Moab,Wegharakwa ebe ndị a rụsiri ike na ya.
N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Moab kpum kpumOtú o si akụ nwaanyị ime na-eme.’”
42 “‘A ga-ebibikwa Moab ka ọ gharazie ịbụ mba,+N’ihi na o buliri onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+
43 Onye bi na Moab, ụjọ ga-atụ gị.
Ị ga-adaba n’olulu, ọnyà ga-amakwa gị.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
44 ‘Onye ọ bụla nke na-agba ọsọ n’ihi ụjọ ga-adaba n’olulu.
Ọnyà ga-amakwa onye ọ bụla nke si n’olulu ahụ na-apụta.’
‘N’ihi na a ga-enwe afọ m ga-ata ndị Moab ahụhụ.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
45 ‘Ndị na-agba ọsọ guzo na ndò Heshbọn. Ike gwụrukwara ha n’ọkpụkpụ.
N’ihi na ọkụ ga-esi na Heshbọn rere pụta.
Ire ọkụ ga-esikwa na Saịhọn pụta.+
Ọ ga-erepịa egedege ihu Moab,Repịakwa isi ụmụ na-akpa aghara.’+
46 ‘Moab, ị ga-ata ahụhụ.
Ndị na-efe Kimọsh+ alaala n’iyi.
N’ihi na a kpụrụla ụmụ nwoke ndị Moab laa obodo ọzọ,Dọrọkwa ụmụ nwaanyị ha n’agha.+
47 Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị e si na Moab dọrọ n’agha.
Ebe a ka ikpe e kpere Moab gwụrụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
^ Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
^ Na Hibru, “ndị niile ma aha ha.”
^ O nwere ike ịbụ, “Nọdụnụ ala n’ala kpọrọ nkụ.”
^ Na Hibru, “A gbajiela mpi Moab.”
^ Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.
^ Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.