Nehemaya 5:1-19
5 Ma, ndị obodo anyị na ndị nwunye ha besiwere ákwá ike n’ihi ihe ụmụnne ha ndị Juu na-eme ha.+
2 Ụfọdụ nọ na-asị: “Anyị na ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị dị ọtụtụ. Anyị ga-enwetarịrị ọka* anyị ga-eri ka anyị wee dịrị ndụ.”
3 Ndị ọzọ nọ na-asị: “Anyị na-enye ugbo anyị na ubi vaịn anyị na ụlọ anyị ka ha bụrụ ihe ibé ka anyị nwee ike inweta ọka* n’oge ụkọ nri.”
4 Ndị ọzọ nọkwa na-asị: “Anyị ejirila ugbo anyị na ubi vaịn anyị gbaziri ego anyị ji tụọ ụtụ eze.+
5 Anyị na ụmụnne anyị bụ otu anụ ahụ́ na otu ọbara, ụmụ anyị dịkwa ka ụmụ ha. N’agbanyeghị ya, anyị na-eme ka ụmụ anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị bụrụ ndị ohu. Ụfọdụ ụmụ anyị ndị nwaanyị abụrụdịla ndị ohu.+ Ma, e nweghị ihe anyị ga-emeli n’ihi na ugbo anyị na ubi vaịn anyị bụzi nke ndị ọzọ.”
6 Mgbe m nụrụ ákwá a ha na-ebe na ihe ndị a ha kwuru, ezigbo iwe were m.
7 M wee chebara ihe ndị a echiche ma baara ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị mba, sị ha: “Onye ọ bụla n’ime unu na-anara nwanne ya ọmụrụ nwa.”+
M kpọkọkwara ndị mmadụ ka e nwee nnukwu nzukọ n’ihi ha.
8 M wee sị ha: “Anyị ejisiela ike gbapụta ụmụnne anyị ndị Juu e resịrị ndị mba ọzọ. Ma ùnu ga-erezi ụmụnne unu?+ Ànyị ga-azụrụzi ha n’aka unu?” Ha amaghị ihe ha ga-ekwu, o nyeghịkwa ha ọnụ okwu.
9 M sịziri: “Ihe unu na-eme adịghị mma. Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịtụ egwu Chineke* anyị,+ ka ndị mba ọzọ, bụ́ ndị iro anyị, ghara ịkọcha anyị?
10 Mụ na ụmụnne m na ndị na-ejere m ozi na-agbazinyekwa ha ego na ọka* n’anaghị ha ọmụrụ nwa. Biko, ka anyị kwụsịnụ ịnara ha ọmụrụ nwa ma anyị gbazinye ha ihe.+
11 Biko, nyeghachinụ ha taa ugbo ha,+ ubi vaịn ha, ubi oliv ha, na ụlọ ha. Nyeghachikwanụ ha ọmụrụ nwa* unu naara ha maka ego, ọka,* mmanya ọhụrụ, na mmanụ unu gbazinyere ha.”
12 Ha wee sị: “Anyị ga-enyeghachi ha ihe a niile, anyị agaghịkwa ana ha ihe ọ bụla. Anyị ga-eme nnọọ ihe i kwuru.” M wee kpọọ ndị nchụàjà ma mee ka ụmụ nwoke ndị ahụ ṅụọ iyi na ha ga-emezu nkwa a ha kwere.
13 M fechakwara uwe m* wee sị: “Ka ezi Chineke si otú a fechapụ onye ọ bụla na-emezughị nkwa a n’ụlọ ya nakwa n’ihe o nwere. Ka e sikwa otú a fechapụ ya ma mee ka ọ gbara aka.” Ọgbakọ ahụ niile wee sị: “Amen!”* Ha wee too Jehova, mmadụ niile mezukwara nkwa ha kwere.
14 Malite n’ụbọchị eze mere m gọvanọ ha+ na Juda, malite n’afọ nke iri abụọ+ ruo n’afọ nke iri atọ na abụọ+ n’ọchịchị Eze Atazaksis,+ ya bụ, afọ iri na abụọ, mụ na ụmụnne m erighị nri e kwesịrị ịna-enye gọvanọ.+
15 Ma ndị bụ́ gọvanọ tupu mụnwa boro ndị obodo anyị ibu arọ. Ha na-anara ha shekel* ọlaọcha iri anọ kwa ụbọchị maka nri na mmanya. Ndị na-ejere ha ozi megbukwara ndị obodo anyị. Ma emeghị m otú ahụ+ n’ihi na m na-atụ egwu Chineke.+
16 M sokwa na-arụ mgbidi a, e nweghịkwa ala anyị nwetaara onwe anyị.+ Ndị niile na-ejere m ozi zukọtakwara n’ebe ahụ maka ọrụ ahụ.
17 Ndị Juu na ndị osote onye na-achị achị bụ́ ndị na-eri ihe na tebụl m dị otu narị na iri ise (150), ha na ndị ọzọ si mba ọzọ.
18 Kwa ụbọchị, a na-akwadebere m* otu oké ehi, atụrụ isii kacha mma, na nnụnụ. Otu ugboro n’ụbọchị iri, a na-ebutekwara m ụdị mmanya dị iche iche n’ụba. N’agbanyeghị ihe a niile, agwaghị m ndị obodo anyị ka ha nye m nri e kwesịrị ịna-enye gọvanọ n’ihi na ibu ha bu karịrị akarị.
19 Chineke m, biko, cheta m ma gọzie m n’ihi ihe niile m meere ndị a.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Na Hibru, “ije ije n’egwu Chineke.”
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
^ Na Hibru, “otu ụzọ n’ụzọ otu narị,” ya bụ, ọmụrụ nwa ha na-akwụ kwa ọnwa.
^ Na Hibru, “M fechapụrụ obi m,” ya bụ, akpa na-adị n’ebe elu elu n’uwe ndị oge ochie.
^ Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
^ Ma ọ bụ “a na-esi n’ego akpa m akwadebe.”