Zefanaya 1:1-18

  • Ụbọchị Jehova dị nso (1-18)

    • Ụbọchị Jehova ji oké ọsọ na-abịa (14)

    • Ọlaọcha na ọlaedo agaghị azọpụtali mmadụ (18)

1  Ihe a ka Jehova gwara Zefanaya* nwa Kọshaị nwa Gedalaya nwa Amaraya nwa Hezekaya n’oge Josaya+ nwa Emọn+ bụ eze Juda:   Jehova kwuru, sị, “M ga-ekpochapụ ihe niile dị n’elu ala.”+   Jehova kwukwara, sị, “M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ. M ga-ekpochapụ nnụnụ na azụ̀+Nakwa ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ mehie*+ nakwa ndị ajọ omume. M ga-egbuchapụkwa ụmụ mmadụ n’elu ala.”   “M ga-esetị aka m mee JudaNa ndị niile bi na Jeruselem ihe. M ga-ekpochapụkwa ndị fọdụrụ ná ndị na-efe Bel ebe a,+Hichapụkwa aha ndị nchụàjà chi ala ọzọ, ha na ndị nchụàjà ndị ọzọ na-ekpere arụsị.+   M ga-ekpochapụkwa ndị na-anọ n’elu ụlọ akpọrọ ihe ndị dị n’eluigwe* isiala,+Nakwa ndị na-akpọrọ Jehova isiala, na-ekwe ya nkwa na ha agaghị ahapụ ya,+Ma, ha ana-ekwekwa Malkam nkwa na ha agaghị ahapụ ya.+   M ga-ekpochapụkwa ndị kwụsịrị iso Jehova+Nakwa ndị na-anaghị achọ Jehova ma ọ bụ ndị na-anaghị ajụ ase ya.”+   Nọrọnụ jii n’ihu Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso.+ Jehova akwadebela àjà ọ ga-achụ. O doola ndị ọ kpọrọ òkù nsọ.   “N’ụbọchị mụnwa bụ́ Jehova ga-achụ àjà, m ga-ata ndị isi Na ụmụ eze+ ahụhụ, taakwa ndị niile na-eyi uwe ndị mba ọzọ ahụhụ.   N’ụbọchị ahụ, m ga-ata ndị niile na-arịgo n’elu ihe dị elu a na-eguzo ekwu okwu* ahụhụ,Ndị na-eme ka e jiri tigbuo zọgbuo na ịghọ aghụghọ mara ụlọ nna ha ukwu.” 10  Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,A ga-anụ mkpu ákwá n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀,+Nụkwa ákwá a na-ebesi ike n’ebe ọhụrụ ndị mmadụ bi n’obodo a,+Nụkwa ụda ihe ndị a na-akụpịasị n’ugwu. 11  Ndị bi na Maktesh,* besienụ ákwá ike,N’ihi na a laala ndị ahịa niile n’iyi.* E bibiela ndị niile na-atụ ọlaọcha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. 12  N’oge ahụ, m ga-eji mpanaka* nyochaa Jeruselem nke ọma. M ga-ata ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha* ahụhụ, ndị na-asị n’obi ha,‘Jehova agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ.’+ 13  A ga-akwakọrọ akụ̀ ha, bibiekwa ụlọ ha.+ Ha ga-arụ ụlọ, ma ha agaghị ebi na ya. Ha ga-akọkwa ubi vaịn, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ya.+ 14  Oké ụbọchị Jehova dị nso.+ Ọ dị nso. O jikwa oké ọsọ na-abịa.+ Ụda a ga na-anụ n’ụbọchị Jehova ga-adị egwu.+ Onye agha ga-eti mkpu ákwá n’ụbọchị ahụ.+ 15  Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị oké iwe,+Ụbọchị ahụhụ na nhụjuanya,+Ụbọchị oké ifufe na ịtọgbọrọ chakoo,Ụbọchị ọchịchịrị na itiri,+Ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị,+ 16  Ụbọchị ndị mmadụ ga-afụ opi ma tie mkpu agha+Ka e bibie obodo ndị a rụsiri ike na ụlọ nche ndị dị n’isi isi mgbidi.+ 17  M ga-akpatara ụmụ mmadụ ezigbo nsogbu. Ha ga-ejegharịkwa dị ka ndị ìsì,+N’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehiere.+ A ga-awụpụ ọbara ha dị ka ájá,Wụpụkwa anụ ahụ́* ha dị ka nsị.+ 18  Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ N’ihi na iwe ya dị ka ọkụ nke ga-erepịa ụwa niile,+Maka na ọ ga-ekpochapụ ndị niile bi n’ụwa. Otú ọ ga-esi ekpochapụ ha ga-adịkwa egwu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Zefanaya pụtara “Onye Jehova Zochiri (Onye Jehova Ji Kpọrọ Ihe).”
Ọ ga-abụ ihe ndị e ji ekpere arụsị ma ọ bụ ihe ndị gbasara ikpere arụsị.
Na Hibru, “ìgwè ndị agha nke eluigwe.” Ọ ga-abụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando.
O nwere ike ịbụ n’elu ihe dị elu a na-eguzo ekwu okwu n’obí eze.
Na Hibru, “N’ihi na e meela ka ndị ahịa niile nọrọ jii.”
Ọ ga-abụ na Jeruselem, ebe dị nso n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀.
Ma ọ bụ “oriọna.”
Na Hibru, “ndị dị ka ikè mmanya.”
Na Hibru, “eriri afọ.”