Zekaraya 10:1-12
10 “Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo n’ụla mmiri.
Ọ bụ Jehova na-eme ka mmiri ruo n’ígwé ojii.
Ọ na-eme ka mmiri zooro ndị mmadụ,+Na-emekwa ka ala mepụtara onye ọ bụla ihe.
2 N’ihi na arụsị ezinụlọ* dị iche iche ekwuola okwu aghụghọ.*
Ndị na-agba afa ahụla ọhụụ ụgha.
Ha na-akọ nrọ na-abaghị uru.
Mbọ ha na-agba ka ha kasie ndị mmadụ obi enweghị isi.
Ọ bụ ya mere ha ga-eji wagharịa ka atụrụ.
Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na e nweghị onye ọzụzụ atụrụ.
3 M na-ewesa ndị ọzụzụ atụrụ iwe dị ọkụ,M ga-emekwa ka ndị isi* obi tara mmiri zaa ajụjụ,N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha elebarala ìgwè atụrụ ya anya,+ ya bụ, ụlọ Juda.
O meekwala ka ha sie ike ma dị ebube ka ịnyịnya o ji aga agha.
4 E si na ya nweta onyeisi.*
E si na ya nweta onye ọchịchị na-akwado ya.*
E si na ya nweta ụta agha.
E si na ya nweta onye nlekọta* ọ bụla, ha niile.
5 Ha ga-adịkwa ka ndị aghaNa-azọ apịtị ndị dị n’okporo ámá ụkwụ mgbe ha na-alụ agha.
Ha ga-alụ agha n’ihi na Jehova nọnyeere ha.+
A ga-emenye ndị na-agba ịnyịnya ihere.+
6 M ga-eme ka ụlọ Juda ka ndị ọzọ ike,M ga-azọpụtakwa ụlọ Josef.+
M ga-akpọghachi ha n’ala ha,N’ihi na m ga-emere ha ebere.+
Ha ga-adị ka ndị ọ na-enwebeghị mgbe m chụpụrụ ha,+N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke ha, m ga-azakwa ha.
7 Ndị Ifrem ga-adị ka dike n’agha.
Obi ga-atọ ha ụtọ ka à ga-asị na ha ṅụrụ mmanya.+
Ụmụ ha ga-ahụ ihe a ma ṅụrịa ọṅụ.
Obi ha ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.+
8 ‘M ga-afụrụ ha mkpọrọhịhị ma kpọkọta ha,N’ihi na m ga-agbapụta ha,+ ha ga-adịkwa ọtụtụ,Ma na-adịkwu ọtụtụ.
9 N’agbanyeghị na m ga-aghasasị ha ka mkpụrụ n’etiti ndị dị iche iche,Ha ga-anọ n’ebe ndị dị anya cheta m.
Ha na ụmụ ha ga-enwetaghachi ume ma lọta.
10 M ga-esi n’Ijipt kpọlata ha,Sikwa n’Asiria kpọkọta ha.+
M ga-akpọta ha na Gilied+ nakwa na Lebanọn,A gaghịkwa enwe ebe ga-aba ha.+
11 Ọ ga-agafere oké osimiri kpata nsogbu na ya.
Ọ ga-eti ebili mmiri ihe n’oké osimiri ahụ, ya adajụọ.+
Mmiri niile dị n’osimiri Naịl ga-ata.
A ga-eweda ihe Asiria ji anya isi ala,Mkpanaka Ijipt agaghịkwa adị.+
12 Mụnwa bụ́ Jehova ga-eme ka ha ka ndị ọzọ ike,+Ha ga na-azakwa aha m.’*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “terafim.”
^ Ma ọ bụ “okwu siri ike nkọwa; ihe dị mgbagwoju anya.”
^ Na Hibru, “mkpi.”
^ Na Hibru, “ụlọ elu dị n’isi mgbidi.” Ọ pụtara nwoke dị ezigbo mkpa.
^ Na Hibru, “mkpọ́.” Ọ pụtara onye na-akwado onye ọzọ; onye ọchịchị.
^ Ma ọ bụ “onyeisi ọrụ.”
^ Na Hibru, “Ha ga na-ejegharị n’aha m.”