AJỤJỤ NKE 9
Ajụjụ nke 9: Gịnị mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ?
“Ọ bụghị mgbe niile ka ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị dike na-emeri n’agha. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ma ihe na-enweta ihe oriri. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na-akpata akụnụba. Ọ bụghịkwa ndị mụtara ihe ka ihe na-agaziri mgbe niile, n’ihi na ọdachi na-abịara ha niile n’oge a na-atụghị anya ya.”
“Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere—.”
“Ọ bụ ya mere e ji mee ka Ọkpara Chineke pụta ìhè, ka o bibie ọrụ Ekwensu.”
“Ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.”