Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A1

Ihe Ndị E Kwesịrị Iburu n’Uche Mgbe A Na-asụgharị Baịbụl

Mgbe e dere Baịbụl, ọ bụ asụsụ Hibru, Arameik, na Grik a na-asụ n’oge ochie ka e ji dee ya. Taa, e nweela Baịbụl, ma nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik ma nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, n’ihe karịrị puku asụsụ atọ (3,000). Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl anaghị aghọta asụsụ ndị mbụ ahụ e ji dee ya. N’ihi ya, ọ bụ Baịbụl a sụgharịrị asụgharị ka ha na-agụ. Olee ihe ndị na-asụgharị Baịbụl kwesịrị iburu n’obi mgbe ha na-asụgharị ya? Oleekwa otú ihe ndị a si nyere ndị sụgharịrị Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ aka?

Ụfọdụ nwere ike iche na ọ bụrụ na a sụgharịa mkpụrụ okwu niile dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl otu otu, ọ ga-eme ka onye na-agụ ya ghọta ihe niile e kwuru n’asụsụ ndị mbụ ahụ. Ma, ọ naghị adịcha otú ahụ mgbe niile. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ kpatara ya:

  • E nweghị asụsụ abụọ ụtọ asụsụ ha, mkpụrụ okwu ha, na otú e si ede ahịrịokwu ha bụ otu. E nwere otu ọkachamara n’asụsụ Hibru aha ya bụ S. R. Driver. O kwuru na asụsụ ọ bụla dị iche ‘n’ụtọ asụsụ, ná mkpụrụ okwu, nakwa n’otú e si ejikọ mkpụrụ okwu dị iche iche ka ha bụrụ ahịrịokwu.’ Otú onye na-asụ otu asụsụ si eche echiche dị iche n’otú onye na-asụ asụsụ ọzọ si eche echiche. Ọkachamara ahụ kwuziri na ‘otú e si ede ahịrịokwu n’otu asụsụ abụghị otú e si ede ya n’asụsụ ọzọ.’

  • E nweghị asụsụ a na-asụ taa nke okwu ya na ụtọ asụsụ ya na nke asụsụ Hibru, Arameik, na Grik e ji dee Baịbụl bụ nnọọ otu. N’ihi ya, a sụgharịa mkpụrụ okwu niile dị n’asụsụ e ji dee Baịbụl otu otu, ihe a sụgharịrị agaghị edo anya. O nwedịrị ike ime ka ihe a sụgharịrị dị iche n’ihe e kwuru na Baịbụl.

  • Ihe otu okwu pụtara n’otu ebe nwere ike ịdị iche n’ihe ọ pụtara n’ebe ọzọ n’ihi okwu ndị ọzọ gbara ya gburugburu.

Onye na-asụgharị Baịbụl nwere ike ịsụgharị okwu ụfọdụ otu otu otú e si dee ha n’asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik, ma o kwesịrị ịkpachara anya mgbe ọ na-eme otú ahụ.

Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ na-egosi na e nwere ike ịghọtahie okwu ụfọdụ ma a sụgharịa ha otu otu otú e si dee ha n’asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik:

  • N’Akwụkwọ Nsọ, okwu bụ́ “ụra” na ‘ihi ụra’ pụtara ma ụra nkịtị ma ọnwụ. (Matiu 28:13; Ọrụ Ndịozi 7:60, ihe e dere n’ala ala peeji ya) Ọ bụrụ na ihe ndị gbara okwu a gburugburu gosiri na ọ bụ ọnwụ ka a na-ekwu, ndị na-asụgharị Baịbụl nwere ike ịsụgharị ya ‘ọnwụ’ ka ọ ghara ịgbagwoju onye na-agụ ya n’oge a anya.—1 Ndị Kọrịnt 7:39; 1 Ndị Tesalonaịka 4:13; 2 Pita 3:4.

  • E nwere ihe Pọl onyeozi dere ná Ndị Efesọs 4:14. A sụgharịa ihe ahụ otú o si dee ya n’asụsụ Grik, ihe ọ ga-abụ bụ “n’okwe ndị mmadụ na-azụ.” Ihe a bụ akpaala okwu a na-ekwu n’oge ochie iji gosi otú ndị mmadụ si aghọgbu ndị ọzọ ma ha zụwa okwe. N’ọtụtụ asụsụ, a sụgharịa ihe a Pọl kwuru otú a o si dee ya, e nweghị ezigbo ihe ndị mmadụ ga-aghọta. Ma a sụgharịrị ya “ndị aghụghọ” ka o doo onye ọ bụla anya.

  • E nwere okwu Grik e dere ná Ndị Rom 12:11. A sụgharịa ya otú e si dee ya n’asụsụ Grik, ihe ọ ga-abụ bụ “na-agbọ agbọ ná mmụọ.” Ma ihe onye Igbo ga-aghọta abụghị ihe okwu ahụ pụtara. N’ihi ya, a sụgharịrị ya “na-anụ ọkụ n’obi.”

  • MATIU 5:3

    A sụgharịa ya otu otu: “ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha”

    Ihe ọ pụtara: “ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha”

    Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu kụzie nkụzi ya a ma ama, o kwuru ihe a na-asụgharịkarị, “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, Baibul Nsọ Ndezighari Ọhuru) Ma n’ọtụtụ asụsụ, ịsụgharị ya otú a e si dee ya na Grik ga-eme ka a ghara ịghọta ihe a na-ekwu. Ihe Jizọs na-akụzi n’ebe a abụghị gbasara ịda ogbenye, kama ọ na-akụzi na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ onye ahụ ikwe ka Chineke na-eduzi ya, ọ bụghị onye ahụ igboro onwe ya mkpa ndị na-agbasaghị ife Chineke. (Luk 6:20) N’ihi ya, ịsụgharị ya “ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha” ma ọ bụ “ndị ghọtara na ọ dị ha mkpa ka Chineke nyere ha aka” mere ka a ghọta ihe okwu Grik ahụ pụtara.—Matiu 5:3.

  • N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, okwu Hibru bụ́ qin·ʼahʹ pụtara ihe na-adịghị mma n’asụsụ Igbo, ya bụ, “ekworo” ma ọ bụ “anyaụfụ.” (Ilu 6:34; Aịzaya 11:13) Ma n’ebe ụfọdụ, okwu Hibru ahụ pụtara ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịpụta “ịnụ ọkụ n’obi” Jehova na-eji emere ndị na-efe ya ihe ma ọ bụkwanụ ọchịchọ “ọ chọrọ ka a na-efe naanị ya.” (Ọpụpụ 34:14; 2 Ndị Eze 19:31; Ezikiel 5:13; Zekaraya 8:2) O nwekwara ike ịpụta ‘ịnụ ọkụ n’obi’ ndị na-efe Chineke ji erubere ya isi ma ọ bụkwanụ ọchịchọ ‘ha na-anaghị achọ ka a hapụ Chineke fewe chi ọzọ.’—Abụ Ọma 69:9; 119:139; Ọnụ Ọgụgụ 25:11.

  • A na-asụgharịkarị okwu Hibru bụ́ yadh “aka,” ma ihe ndị e kwuru gburugburu ya nwere ike ime ka a sụgharịa ya “ikike,” “ike,” ma ọ bụ ihe ọzọ

    Okwu Hibru a na-asụgharịkarị aka mmadụ nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara. Ihe ndị e kwuru gburugburu ebe okwu a gbara nwere ike ime ka a sụgharịa ya “ikike” ma ọ bụ “ike.” (Aịzaya 57:10; Jeremaya 5:31) Nke bụ́ eziokwu bụ na a sụgharịrị otu okwu a otú dị iche iche n’ọtụtụ ebe ọ gbara na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

N’ihi ihe ndị a e kwuru, ịsụgharị Baịbụl abụghị ịsụgharị okwu Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik otu ihe n’ebe ọ bụla ọ gbara. Onye na-asụgharị Baịbụl kwesịrị ilezi anya họta okwu ga-asụgharị ihe okwu Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik ọ na-asụgharị pụtara. O kwesịkwara ịgba mbọ hazie okwu ndị dị n’ahịrịokwu ọ na-asụgharị ka ọ daba n’ụtọ asụsụ ọ na-asụgharị nakwa n’otú e si ede ihe n’asụsụ ahụ, ka ihe ọ sụgharịrị dị mfe ọgụgụ.

Ma o kwesịghị ide ihe dị iche n’ihe e dere na Baịbụl. Ọ bụrụ na ihe onye na-asụgharị Baịbụl na-eme bụ ịkọwa ihe e dere na Baịbụl otú ọ ghọtara ya, o nwere ike ide ihe na-abụghị ihe Baịbụl kwuru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ maka na onye na-asụgharị Baịbụl nwere ike idenye ihe yanwa chere, bụ́ nke na-adịghị n’asụsụ Hibru, Arameik, ma ọ bụ na Grik ọ na-asụgharị, ma ọ bụkwanụ ya ahapụ idenye ihe ndị dị mkpa o kwesịrị idenye. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na Baịbụl a kọwara akọwa nwere ike ịdị mfe ọgụgụ, ma isi otú a asụgharị Baịbụl nwere ike ime ka onye na-agụ Baịbụl ghara ịghọta isi ihe ebe ọ na-agụ na-ekwu.

Ihe onye na-asụgharị Baịbụl kweere nwere ike ime ka ọ sụgharịa Baịbụl otú dị ya mma. Dị ka ihe atụ, Matiu 7:13 kwuru, sị: “Okporo ụzọ dị obosara na-eduba ná mbibi.” Ma ụfọdụ ndị nsụgharị sụgharịrị okwu Grik a sụgharịrị “mbibi” n’amaokwu a “ọkụ.” O nwere ike ịbụ ihe ha kweere mere ha ji sụgharịa ya otú ahụ. Ma n’eziokwu, ihe okwu Grik ahụ pụtara bụ “mbibi.”

Ihe ọzọ onye na-asụgharị Baịbụl kwesịrị iburu n’obi bụ na asụsụ e ji dee Baịbụl bụ asụsụ mmadụ niile na-aghọta, ya bụ, asụsụ ndị ọrụ ubi, ndị na-azụ atụrụ, ndị na-akụ azụ̀, na ndị ọzọ na-agụghị oké akwụkwọ na-aghọta. (Nehemaya 8:8, 12; Ọrụ Ndịozi 4:13) N’ihi ya, Baịbụl a sụgharịrị nke ọma na-eme ka ndị chọrọ ife Chineke ghọta ihe Baịbụl na-ekwu, n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụ ụdị ndị ha bụ. O doro anya na ọ ka mma ide okwu onye ukwu na onye nta ga-aghọta ozugbo, kama ide okwu ndị na-agụghị oké akwụkwọ na-anaghị ekwukarị.

Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl emeela ihe ha na-ekwesịghị ime. Ha ewepụla aha Chineke, bụ́ Jehova, na Baịbụl ndị ha sụgharịrị n’oge anyị a, n’agbanyeghị na aha ahụ dị na Baịbụl n’oge e dere ya. (Gụọ A4.) Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji utu aha ndị dị ka “Onyenwe anyị” dochie aha ahụ. Ụfọdụ n’ime ha medịrị ka o yie ka Chineke enweghị aha. Dị ka ihe atụ, na Baịbụl ụfọdụ, otú e si sụgharịa ihe Jizọs kwuru n’ekpere e dere na Jọn 17:26 bụ: “Emere m ka ha mara gị.” Otú ha si sụgharịa Jọn 17:6 bụ: “Emeela m ka ndị ahụ i siri n’ụwa kpọnye m mara onye ị bụ.” Ma otú e kwesịrị isi sụgharịa ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ bụ: “Emeela m ka ha mara aha gị,” na “Emeela m ka ndị i si n’ụwa nye m mara aha gị.”

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mbụ e bipụtara n’asụsụ Bekee, e dere n’okwu mmalite ya, sị: “Anyị anaghị akọwa Akwụkwọ Nsọ akọwa. Anyị gbalịsiri ike hụ na anyị sụgharịrị Baịbụl a otú e si dee ya n’asụsụ e ji dee Baịbụl n’ebe ọ bụla ọ dabara n’otú e si ede asụsụ Bekee n’oge a nakwa n’ebe ịsụgharị ya otú e si dee ya n’asụsụ e ji dee Baịbụl na-agaghị eme ka a ghara ịghọta ihe a na-ekwu.” N’ihi ya, Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ gbalịsiri ike sụgharịa okwu ụfọdụ otú e si dee ha na Hibru, Arameik, ma ọ bụ Grik. Ma ha kpachaara anya ka ha ghara ide ihe ga-agbagwoju ndị mmadụ anya ma ọ bụ mee ka ihe ha dere dị iche n’ihe Baịbụl na-ekwu. Otú a e si sụgharịa Baịbụl a ga-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ọgụgụ, obi esiekwa onye na-agụ ya ike na ọ bụ nnọọ ihe e kwuru na Baịbụl ka a sụgharịrị.—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.