NA-ECHENỤ NCHE!
Ndị Sayensị Ewegala Aka Elekere Dumsdee Ihu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2023, ndị sayensị wegara aka Elekere Dumsdee a ebe ọ fọrọ nnọọ ntakịrị ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị. Ha ji ya na-egosi na oge ụwa ga-emebi adịla ezigbo nso.
Ụlọ ọrụ nta akụkọ AFP International Text Wire kwuru sị, “Na Tuzdee, e wegara aka ‘Elekere Dumsdee,’ bụ́ ihe na-egosi ọdachi ụmụ mmadụ ga-akpata n’ụwa a, n’ebe ọ fọrọ obere ka elekere iri na abụọ nke ime abalị kụọ. Ihe a bụ nke mbụ a na-ewegaru ya ebe ahụ. Ihe mere ha ji wega ya ebe ahụ bụ maka nsogbu ndị dị ka agha a na-alụ na Yukren, ụjọ ndị sayensị na-atụ na a ga-atụwa ngwá agha ọgwụrụ mba n’agha ahụ, na nsogbu oké okpomọkụ na oké mmiri ozuzo na-akpata.”
Ndị nta akụkọ ABC kwuru na n’ụbọchị Tuzdee, ndị sayensị kwuru na e wegala aka ‘Elekere Dumsdee’ ebe ọ fọrọ otu nkeji na ọkara ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị. Nke a bụ nke mbụ ụmụ mmadụ na-eru ebe ọ fọrọ obere ka ha bibie onwe ha.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian kwuru na ndị sayensị si mba dị iche iche kwuru na ihe ndị na-eme na-egosi na ụmụ mmadụ ga-ebibi onwe ha n’oge na-adịghịzi anya.
À ga-ebibi ndị mmadụ na ụwa anyị a n’oge na-adịghị anya? Ànyị kwesịrị ịna-atụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu? Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Ihe ga-eme n’ọdịnihu
Baịbụl kwuru na “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi” nakwa na a ga-enwe ndị ‘ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.’ (Ekliziastis 1:4; Abụ Ọma 37:29) Ọ pụtara na ụmụ mmadụ agaghị ebibi ụwa, ha agaghịkwa eme ya otú ihe ọ bụla na-agaghị adị ndụ na ya.
Ma, Baịbụl kwuru gbasara ọgwụgwụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na “ụwa na-agafe agafe.”—1 Jọn 2:17.
Ị chọọ ịghọta ihe ọgwụgwụ ụwa Baịbụl kwuru okwu ya pụtara, gụọ isiokwu bụ́ “Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso? Gịnị Bụ Apọkalips?”
Ị chọọ ịmata ihe Baịbụl kwuru banyere oge ihe ndị ga-eme n’ụwa ga-eme, gụọ isiokwu bụ́ “When Will the World End?”
Na-atụ anya ihe ọma
Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịna-atụ anya ihe ọma n’agbanyeghị nsogbu ndị juru n’ụwa a. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ ndị na-enyere anyị aka kwa ụbọchị. (2 Timoti 3:16, 17) Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “How to Control Worry” ka ị hụ otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka inwe olileanya n’agbanyeghị nsogbu.
Baịbụl na-eme ka anyị nwee ezigbo olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. (Ndị Rom 15:4) Ọ kọwara kpọmkwem ihe anyị ga na-atụ anya ya ugbu a nakwa n’ọdịnihu. Ihe ndị a na-enyere anyị aka inwe obi ike n’agbanyeghị ihe ndị na-eme n’ụwa taa.
Iji matakwuo ihe Baịbụl na-akụzi, anyị na-agba gị ume ka ị mụwa Baịbụl. I nwere ike ikwu ka anyị na gị mụwa ya.
a “Akwukwọ akụkọ a na-akpọ Bulletin of the Atomic Scientists kwuru, sị “Elekere Dumsdee (Doomsday Clock) bụ ihe e ji agwa ọhaneze na a chọwala iji nkà na ụzụ ụmụ mmadụ mepụtara mebie ụwa anyị a. Ọ bụ ihe atụ e ji echetara anyị ihe anyị ga-emerịrị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-adị ndụ n’ụwa a.”