Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahmad Gharabli/AFP via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Mba Dị Iche Iche Hà Ga-ejikọli Aka Dozie Ihe Ndị Na-akpata Ọdachi n’Ụwa A?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Mba Dị Iche Iche Hà Ga-ejikọli Aka Dozie Ihe Ndị Na-akpata Ọdachi n’Ụwa A?​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Na Sọnde, abalị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba, afọ 2022, mba ndị so n’Òtù Mba Ụwa nwere nnọkọ ikpeazụ ná nnọkọ ha na-enwe gbasara idozi ihe ndị na-akpa ụwa aka ọjọọ ma na-akpatara ndị bi na ya ọdachi, dị ka oké okpomọkụ, oké ọkọchị, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ndị bịara nnọkọ a kwekọrịtara na ha ga-enye ego a ga-eji nyere mba ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka. Ma, ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụghị ihe a ha kwere nkwa ime ga-akwụsị isi sekpụ ntị na-akpata ọdachi ndị a.

  •   N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Nọvemba, afọ 2022, odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Mba Ụwa aha ya bụ António Guterres kwuru na ya nabatara mkpebi a ha mere ka a na-enyere ndị ụdị ọdachị ndị a dakwasịrị aka. Ma, o kwukwara na ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri, na ụwa anyị a nọ n’ọnọdụ ọjọọ e kwesịrị ilebara anya ngwa ngwa ka ihe ghara imebicha.

  •   N’abalị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba, afọ 2022, Mary Robinson kwuru na ụwa a nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya n’ihi na ihe ndị dị ka oké okpomọkụ, oké ọkọchị, ọdachi ndị na-emere onwe ha na ihe ndị yiri ha nwere ike imebisị ụwa n’oge na-adịghị anya, kpatakwara mmadụ niile ọdachi. Mary Robinson bụ onye na-achịbu Ayaland, ọ bụbukwa onyeisi na ngalaba Òtù Mba Ụwa nke na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ.

 Ọ bụ ndị na-eto eto kacha echegbu onwe ha gbasara otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Ma, mba dị iche iche hà ga-ejikọli aka mezuo nkwa ha kwere na ha ga-edozili ihe ndị na-akpata ọdachi ndị a n’ụwa a? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Mba dị iche iche hà ga-emezuli ihe ha kwekọrịtara?

 Baịbụl kwuru na n’agbanyeghị otú mba dị iche iche si jiri obi ọcha ha na-arụsi ọrụ ike ma na-agbasi mbọ ike na-eme ka ihe ndị na-akpata ọdachi n’ụwa belata, ha agaghị emeli ka nsogbu a kwụsị kpamkpam. Lee ihe abụọ mere o ji dị otú ahụ:

  •   “A gaghị edozili ihe gbagọrọ agbagọ.”​—Ekliziastis 1:15.

     Ihe ọ pụtara: E nwere ọtụtụ ihe ndị ọchịchị na-agaghị emeli n’ihi na e keghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. (Jeremaya 10:23) Ọ bụrụgodị na mba dị iche iche jikọrọ aka kpebie idozi nsogbu ndị dị n’ụwa a, ha agaghị edozili ha, ihe ọ sọkwara ha mee.

  •   “N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla.”​—2 Timoti 3:​2, 3.

     Ihe ọ pụtara: Baịbụl buru amụma na ọtụtụ ndị n’oge a ga na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru kama ịgba mbọ ka ihe dịrị mmadụ niile ná mma.

Ihe mere anyị ji kwesị inwe olileanya

 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị nkwa ndị ọchịchị mba dị iche iche kwere ga-ekpebi otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Chineke ahọpụtala Onye ruru eru ga-achị ụwa. Aha ya bụ Jizọs Kraịst. Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị:

  •   Ọchịchị ga-adị n’aka ya. A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube, Chineke bụ́ Dike, Nna Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.”​—Aịzaya 9:6.

 Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke, ma ọ bụ ọchịchị dị n’eluigwe. (Matiu 6:10) Jizọs nwere ike na amamihe ọ ga-eji lekọta ụwa na ndị niile bi na ya, ọ dịkwa ya n’obi ime ya. (Abụ Ọma 72:12, 16) Ọ ga-eji ọchịchị ya a dị n’eluigwe bibie “ndị na-ebibi ụwa,” doziekwa ihe niile na-akpata ọdachi n’ụwa a.​—Mkpughe 11:18; Aịzaya 35:1, 7.

 Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú a ga-esi dozie ihe ndị na-akpa ụwa aka ọjọọ ka ha kwụsị kpamkpam, dị ka oké okpomọkụ, oké ọkọchị, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na ihe ndị ọzọ yiri ha, gụọ isiokwu bụ́ “Climate Change and Our Future​—What the Bible Says.”