Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụ nke 111

Ọ Ga-akpọ Òkù

Ọ Ga-akpọ Òkù

(Job 14:​13-⁠15)

1. Ndụ n’apụta dị k’igirigi

Ma n’apụ n’anya echi.

Ihe anyị bụ pụr’ịgwụ ozugbo,

Iru uju anọchie.

Onye nwụr’anwụ ọ̀ g’adị ndụ ọzọ?

Chineke kwer’anyị nkwa:

(KORỌS)

Ọ g’akpọ Ndị nwụr’anwụ.

Ọ kpọọ ha, ha g’ebili.

Ịhụ ọrụ aka ya

G’agụsi y’agụụ ike.

Nwe’okwukwe, enwel’obi abụọ,

Ọ g’akpọlite anyị

Ịdị ndụ ebigh’ebi,

Eb’anyị bụ ọrụ aka ya.

2. Ndị enyi Chineke nwer’ik’ịnwụ,

Ma ọ gagh’echefu ha.

Ndị niile nọ n’ili ncheta ya

K’ọ g’akpọlite n’ọnwụ.

Mgbe ahụ k’anyị g’am’ihe ndụ bụ:

Paradaịs ebigh’ebi.

(KORỌS)

Ọ g’akpọ Ndị nwụr’anwụ.

Ọ kpọọ ha, ha g’ebili.

Ịhụ ọrụ aka ya

G’agụsi y’agụụ ike.

Nwe’okwukwe, enwel’obi abụọ,

Ọ g’akpọlite anyị

Ịdị ndụ ebigh’ebi,

Eb’anyị bụ ọrụ aka ya.