Abụ nke 88
Ụmụ Bụ Ihe Nketa Si n’Aka Chineke
1. Mgbe nwoke ghọrọ nna,
Mgbe nwunye ya mụtaara ya nwa,
Ha g’echeta n’e nyela h’ihe
N’abụghị nke naanị ha.
Ọ bụ Jaa nyere h’onyiny’ahụ;
Ọ bụ ya n’enye ndụ na ịhụnanya.
Ọ n’eduzi ndị nne na nna
Ka ha soro ụzọ kacha mma.
(KORỌS)
O nyer’unu onyinye dị nsọ,
Nk’unu ga n’elekọta.
Ih’ọma ị g’emere nwa gị
Bụ izi y’iwu Chineke.
2. Iwu dum Chineke nyere
Ga n’adị n’obi unu mgbe niile.
Unu ga n’ezi ya ụm’unu;
Ọ bụ ọrụ dịịrị unu.
N’ezi ha ya mgb’unu nọ n’ụzọ,
Mgb’unu n’ezu ike m’ọ bụ bilie.
N’ọdịnihu, ka ha cheta ya,
Ka ha n’eme ya, k’a gọzie ha.
(KORỌS)
O nyer’unu onyinye dị nsọ,
Nk’unu ga n’elekọta.
Ih’ọma ị g’emere nwa gị
Bụ izi y’iwu Chineke.
(Gụọkwa Diut. 6:6, 7; Efe. 6:4; 1 Tim. 4:16.)