Abụ nke 31
Anyị Bụ Ndịàmà Jehova!
1. ’Madụ mere chi osisi,
H’amagh’ezi Chineke
Pụr’ime ihe dum,
Dị k’o gosiri.
Chi ndị ọzọ amaghị
Ihe ndị g’eme echi.
Ha enweghị ndị n’agba àmà,
N’ihi na h’abụgh’ezi chi.
(KORỌS)
A’yị bụ Ndịàmà Jehova.
A’yị n’ekwu n’atụgh’egwu.
Chi anyị bụ Chi ezi amụma;
Ihe o kwuru n’emezu.
2. A’yị ji ọṅụ ekwus’aha ya,
N’agb’àmà ịdị ukwuu ya,
N’ekwus’Al’eze ya
N’atụghị egwu.
Ndị ọzọ pụr’ịmụta
Eziokwu Chinek’anyị.
Ha sie ike, ha g’esor’anyị
N’abụ abụ otuto ya.
(KORỌS)
A’yị bụ Ndịàmà Jehova.
A’yị n’ekwu n’atụgh’egwu.
Chi anyị bụ Chi ezi amụma;
Ihe o kwuru n’emezu.
3. Ịgb’àmà n’eto aha Jaa,
Wepụkwa nkọcha ya,
Dọọ ndị ọjọ’aka ná ntị.
Ha n’ekwutọ ya.
Ọ n’agbaghara ndị
Laghachikwutere ya.
Ịgb’àmà n’ewet’ọṅụ n’udo
N’olil’anya ndụ ebigh’ebi.
(KORỌS)
A’yị bụ Ndịàmà Jehova.
A’yị n’ekwu n’atụgh’egwu.
Chi anyị bụ Chi ezi amụma;
Ihe o kwuru n’emezu.
(Gụọkwa Aịza. 37:19; 55:11; Ezik. 3:19.)