Abụ nke 40
Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze
1. Ihe bara oké uru
Nke n’enye Jaa ọṅụ
Bụ Al’eze ya nke Kraịst g’achị,
Nke g’edoz’ihe dum.
(KORỌS)
Bur’ụzọ n’achọ Al’eze
N’ezi omume Jehova.
Toonụ ya ná mba niile,
Nọsie ike n’ozi ya.
2. Echegbukwala onwe gị
Maka nri n’ih’ọṅụṅụ.
Chineke g’egbor’anyị mkpa
M’anyị bu ‘zọ chọ’Al’eze.
(KORỌS)
Bur’ụzọ n’achọ Al’eze
N’ezi omume Jehova.
Toonụ ya ná mba niile,
Nọsie ike n’ozi ya.
3. N’ekwusa ozi ọm’Al’eze;
Mee ka ndị chọrọ hụ
N’olil’anya ha dị na Jaa,
Dịrịkwa n’ọchịchị ya.
(KORỌS)
Bur’ụzọ n’achọ Al’eze
N’ezi omume Jehova.
Toonụ ya ná mba niile,
Nọsie ike n’ozi ya.
(Gụọkwa Ọma 27:14; Mat. 6:34; 10:11, 13; 1 Pita 1:21.)