Abụ nke 19
Chineke Kwere Nkwa Paradaịs
1. Lee, paradaịs bụ nkwa Chineke,
Si n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst,
Ọ g’ewepụ mmehie niile,
Anya ’miri, ọnwụ, n’ọrịa.
(KORỌS)
Lee, paradaịs k’ụwa g’abụ.
A’yi ji okwukwe n’ahụ ya y’ugbu a.
Kraịst g’eme ya n’isi nso,
Im’uche Jaa n’atọ y’ụtọ.
2. Ọ b’uche Jaa ka Ọkpara ya
Kpọlite ndị nwụrụ anwụ.
Kraịst g’emezu nkwa o kwere:
‘Anyị g’anọ na Paradaịs.’
(KORỌS)
Lee, paradaịs k’ụwa g’abụ.
A’yi ji okwukwe n’ahụ ya y’ugbu a.
Kraịst g’eme ya n’isi nso,
Im’uche Jaa n’atọ y’ụtọ.
3. Lee Paradaịs Kraịst kwere ná nkwa.
Ọ bụ Eze g’achị ụwa.
A’yị n’ekele ezigbo Nna anyị,
N’abụku ya abụ otuto.
(KORỌS)
Lee, paradaịs k’ụwa g’abụ.
A’yi ji okwukwe n’ahụ ya y’ugbu a.
Kraịst g’eme ya n’isi nso,
Im’uche Jaa n’atọ y’ụtọ.
(Gụọkwa Mat. 5:5; 6:10; Jọn 5:28, 29.)