Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Meri Dị Umeala n’Obi ma Na-erube Isi

Meri Dị Umeala n’Obi ma Na-erube Isi

Were Ya:

  1. 1. Ka Meri nọ na Galili,

    Obodo dịn-so na Jọdan,

    Jehova ziri Gebriel

    K’ọ bịa n’ụwa gwa Meri, sị:

    ‘Jehova sịrị n’ọ bụ gị

    G’amụ Nwa y’ọ hụrụ n’anya.

    Ike ya g’esi n’eluigwe

    Kpuchite gị ma chebe gị.’

    (TUPU UKWE)

    Ihe niile Jehova kwuru,

    Meri kwetara ma rub’isi.

    (UKWE)

    M g’eme ka Meri,

    N’akwado Jehova.

    M ga n’eme k’obi ya ṅụrịa.

    M g’erub’isi ma n’agbalị kam bụrụ

    Ụdị ‘madụ Meri bụ.

  2. 2. Meri mechara dịr’ime

    Dị ka Jehova gwara ya.

    Ma, Josef chọr’ịhapụ ya.

    M’o mechara kweta lụọ ya.

    N’ụlọa-nụ dị na Betlehem

    Ka Meri mụrụ Jizọs Kraịst.

    Ihe niile Baịbụl kwuru,

    Ha mezuru dị k’o si kwuo.

    (TUPU UKWE)

    Ha bidoro n’oge zụwa ya.

    Jizọs toro bụr’ezigbo nwa.

    (UKWE)

    M g’eme ka Meri,

    N’akwado Jehova.

    M ga n’eme k’obi ya ṅụrịa.

    M g’erub’isi ma n’agbalị kam bụrụ

    Ụdị ‘madụ Meri bụ.

    (UKWE)

    M g’eme ka Meri,

    N’akwado Jehova.

    M ga n’eme k’obi ya ṅụrịa.

    M g’erub’isi ma n’agbalị kam bụrụ

    Ụdị ‘madụ Meri bụ.