Na-agbaghara Kpamkpam
Danloduo:
Akwụkwọ Egwú
1. E nwer’onye kpasurum iwe.
Ma, gịnị g’eme k’anyị mezie?
Gịnị g’eme k’anyị kpezie?
M kwesịrị ịgbaghara ya.
Ma, m chewe na o sighịm n’aka,
Obim agagh’ekwem gbaghara.
(TUPU UKWE)
Kam jisi’ike kọọrọ ya Chinekem.
Jehova maar’ihe niile n’ewutem.
Ọ g’enyerem aka ma
(UKWE)
Mee kam wetu’obi.
Ọ bụ ya g’emedam obi.
Biko, Jehova Chineke,
Mee kam n’agbaghara.
A’yị mejọọ Jehova,
Ọ n’agbaghara ma n’echefu ya.
Biko, Jehova Chineke,
Mee kam n’agbaghara.
N’agbaghara.
2. M gbalịrị kam kwụs’iw’iwe.
Man’iwe ka jurum n’obi.
Gịnị g’eme k’iwe pụọm n’obi?
Ihe g’eme k’anyị dị nám-ma
Bụ mam gbaghara ma chefuchaa ya.
Ọ bụ ya g’enyerem aka.
(TUPU UKWE)
Kam jisi’ike kọọrọ ya Chinekem.
Jehova maar’ihe niile n’ewutem.
Ọ g’enyerem aka ma
(UKWE)
Mee kam wetu’obi.
Ọ bụ ya g’emedam obi.
Biko, Jehova Chineke,
Mee kam n’agbaghara.
A’yị mejọọ Jehova,
Ọ n’agbaghara ma n’echefu ya.
Biko, Jehova Chineke,
Mee kam n’agbaghara.
N’agbaghara.
N’agbaghara.
N’agbaghara.
N’agbaghara.