Ònye Ka M Ga-alakwuru?
Were Ya:
1. Igen-tị n’olu Jizọs
N’eme kam dịr’ike.
Ọ bụ ya n’edum
N’og’ihe sir’ike.
N’Al’eze Chineke
Ka Jizọs g’edubam
Mam gbalịsi’ike
Soro ya ruo n’isi.
(TUPU UKWE)
Gịnị g’eme kam soro
Ndị hapụrụ Jehova?
Gịnị g’eme kam kwe
K’ụwa mee kam sowe ha?
(UKWE)
Ònye kam g’alakwuru?
N’ogen-sogbu, ole’ebem g’aga?
Ònye kam g’alakwuru?
Agaghịm esoro
Ụzọ Setan n’eso.
Ọ bụ naanị Jizọs kam n’eso.
2. Obi sirim ike na
Jizọs g’elekọtam.
Ụmụnnam niile
Ga n’elekọtakwam.
Al’eze Chineke
Bụo-lileanyam nwere.
O zitere Jizọs
K’ọ bịa zọpụtam.
(TUPU UKWE)
Agaghịm esoro
Ndị hapụrụ Jehova.
Gịnị g’eme kam kwe
K’ụwa mee kam sowe ha?
(UKWE)
Ònye kam g’alakwuru?
N’ogen-sogbu, ole’ebem g’aga?
Ònye kam g’alakwuru?
Agaghịm esoro
Ụzọ Setan n’eso.
Ọ bụ naanị Jizọs kam n’eso.
(UKWE)
Ònye kam g’alakwuru?
N’ogen-sogbu, ole’ebem g’aga?
Ònye kam g’alakwuru?
Agaghịm esoro
Ụzọ Setan n’eso.
Ọ bụ naanị Jizọs kam n’eso.
Ònye kam g’alakwuru?
Nna, ekwela kam hapụ gị.