Jekọb na Leban Agbaa Ọgbụgba Ndụ Udo
Gịnị mere Jekọb na Leban ji mee ikpo nkume?
-
Ọ bụ ka ndị niile na-esi ebe ahụ agafe jiri ya mara maka ọgbụgba ndụ udo ahụ ha gbara
-
Ọ bụ ka ọ na-echetara ha na Jehova na-ele ha iji mara ma hà ga-edebe ọgbụgba ndụ udo ahụ ha gbara
Taa, Jehova chọrọ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Olee otú ihe atọ ndị a ga-esi nyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’udo ma ọ bụkwanụ dozie esemokwu?
-
Anyị na ha ikwurịta ihe na-esere anyị.—Mat. 5:23, 24
-
Ịgbaghara kpamkpam.—Kọl. 3:13
-
Inwe ndidi.—Rom 12:21