Jenụwarị 2- 8
AỊZAYA 24-28
Abụ nke 12 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Na-elekọta Ndị Ya”: (Nkeji 10)
Aịza. 25:4, 5—Jehova bụ ebe mgbaba ndị chọrọ ife ya (ip-1 272 ¶5)
Aịza. 25:6—Jehova na-emezu nkwa ya nke bụ́ na ọ ga na-enyeju anyị nri ime mmụọ afọ (w16.05 24 ¶4; ip-1 273 ¶6-7)
Aịza. 25:7, 8—N’oge na-adịghị anya, a ga-ewepụ mmehie na ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi (w14 9/15 26 ¶15; ip-1 273-274 ¶8-9)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Aịza. 26:15—Olee otú anyị nwere ike isi nye aka mgbe Jehova ‘na-agbatị ókè niile nke ala a’? (w15 7/15 11 ¶18)
Aịza. 26:20—Gịnị ka ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ ‘ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime’ e buru n’amụma? (w13 3/15 23 ¶15-16)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Aịza. 28:1-13
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Kwadebe Otú Anyị Ga-esi Zie Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Kpọnye vidio ndị na-egosi otú anyị ga-esi ezi ozi ọma n’ọnwa a. E lechaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya. N’ọnwa Jenụwarị, ndị nkwusa hụ onye chọrọ ịmatakwu gbasara ihe mere Chineke ji kee ụwa, ha nwere ike inye ya broshọ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Ha nwere ike ịkọwara ya ihe dị na peeji nke 22 na nke 23 na broshọ ahụ.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 15) Ma ọ bụ unu atụlee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ. (yb16 140-142)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 6 ¶8-15, na igbe dị na peeji nke 63
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 66 na Ekpere