OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Hụrụ Gị n’Anya
Jehova ji gị kpọrọ ihe. (Aịza. 43:4) Ọ dọtara gị n’ebe ọ nọ, kpọbatakwa gị ná nzukọ ya. Ebe ọ bụ na i nyefere Jehova onwe gị, meekwa baptizim, ị bụ nke ya. Ọ ga na-elekọtakwa gị nke ọma, ma mgbe ihe siiri gị ike. Ọ ga-esikwa n’aka nzukọ ya gosi gị na ọ hụrụ gị n’anya.—Ọma 25:10.
Anyị chee banyere otú nzukọ Jehova si gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka mgbe e nwere ọdachi ndị na-emere onwe ha na nso nso a, ọ ga-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ maka ịhụnanya Jehova.
LEENỤ VIDIO BỤ́ AKỤKỌ KỌMITII NA-AHAZIRI ÒTÙ NA-ACHỊ ISI ỌRỤ NKE AFỌ 2019, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú Kọmitii Na-ahaziri Òtù Na-achị Isi Ọrụ sirila kwadebe alaka ụlọ ọrụ dị iche iche maka ịgbatara ụmụnna ọsọ enyemaka ma e nwee ọdachi?
-
Olee otú nzukọ Jehova si nye ntụziaka ma gbatara ụmụnna ọsọ enyemaka n’Indoneshia nakwa na Naịjirịa mgbe e nwere ọdachi?
-
Olee ihe masịrị gị n’otú nzukọ Jehova si enyere anyị aka n’oge a e nwere ọrịa koronavaịrọs?