Jenụwarị 3-9
NDỊ IKPE 15-16
Abụ nke 124 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ịrara Mmadụ Nye n’Aka Ndị Iro Ya Jọgburu Onwe Ya”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ikpe 16:1-3—Gịnị ka amaokwu ndị a pụtara? (w05 3/15 27 ¶6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Ikpe 16:18-31 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: Chineke Na-eche Banyere Anyị—Mat. 10:29-31. Mgbe ọ bụla ajụjụ pụtara na vidio ahụ, kwụsịtụ ya ma jụọ ụmụnna ajụjụ ndị ahụ. Ha zachaa, a kpọnyekwa ya.
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Nyezie ya broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, gosikwa ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. (th ihe ọmụmụ nke 9)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Baịbụl Mere Ka Alụmdi na Nwunye Anyị Ghara Itisa: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee ndụmọdụ Baịbụl nyeere di na nwunye nke ọ bụla aka ka ha ghara itisa? Olee otú ibidoghachi mechiwe ihe gbasara ofufe Chineke anya si nyere ha aka? Gịnị mere ike ekwesịghị ịgwụ di na nwunye ná mbọ ha na-agba idozi nsogbu ha? Olee ebe di na nwunye ga-esi nweta enyemaka?—Jems 5:14, 15.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 20 ¶1-7 na igbe dị na peeji nke 156
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 149 na Ekpere