Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịna-abịa Ọmụmụ Ihe

Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịna-abịa Ọmụmụ Ihe

Otu n’ime ihe ndị dị mkpa anyị na-eme n’ofufe Jehova bụ ịga ọmụmụ ihe. (Ọma 22:22) Ndị niile na-ezukọta maka ife Jehova na-enwe obi ụtọ, na-enwetakwa ngọzi Jehova. (Ọma 65:4) Ndị a na-amụrụ Baịbụl na-aka enwe ọganihu ma ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya.

Olee otú ị ga-esi nyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka ịmalite ịbịa ọmụmụ ihe? Akwụsịla ịna-agwa ha ka ha bịa ọmụmụ ihe. Gosi ha vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Kọwaakwara ha uru ọmụmụ ihe anyị bara. (lff isi nke 10) I nwere ike ịkọrọ ha otu ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe, ma ọ bụkwanụ gị agwa ha ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe na-abịa abịa. Nye ha akwụkwọ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na enyemaka dị onye ị na-amụrụ ihe mkpa iji bịa ọmụmụ ihe, nyere ya aka. O nwere ike ịbụ na o nweghị ego ụgbọ. Mbọ niile ị gbara ga-eme gị obi ụtọ ma onye ị na-amụrụ ihe mechaa bịa ọmụmụ ihe.​—1 Kọr. 14:​24, 25.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NYERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊNA-ABỊA ỌMỤMỤ IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ohere Linda ji gwa Joy ka ọ bịa ọmụmụ ihe?

  • Gịnị mere obi ji atọ anyị ụtọ ma onye anyị na-amụrụ Baịbụl bịa ọmụmụ ihe?

  • “N’eziokwu, Chineke nọnyeere unu”

    Gịnị ka Joy hụrụ mgbe mbụ ọ bịara ọmụmụ ihe?