AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Unu Akwụsịla Ọrụ Ahụ A Na-arụ”
Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jeshụa (Joshụa) na Gọvanọ Zerubabel malitere ịrụghachi ụlọ nsọ Chineke n’agbanyeghị na a machiri ịrụghachi ya (Ezra 5:1, 2; w22.03 18 ¶13)
Mgbe ndị mmegide jụrụ ndị Juu onye nyere iwu ka ha rụghachi ya, ha gwara ha gbasara iwu Saịrọs nyere ka ha mee otú ahụ (Ezra 5:3, 17; w06 1/15 17 ¶4)
Eze chọpụtara na e nyere iwu ahụ n’eziokwu, ya agwazie ndị mmegide ahụ ka ha ghara ịkwụsị ọrụ ahụ (Ezra 6:7, 8; w22.03 15 ¶7)
AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú akụkọ a a kọrọ na Baịbụl si enyere anyị aka ịnabata ntụziaka si n’aka ndị Jehova họpụtara ka ha na-eduzi anyị, ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ya?—w22.03 19 ¶16.