OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?
Mmadụ na ibe ya na-abụ enyi ma ọ bụrụ na ihe ha na-amasị ibe ha, ha ana-akwanyekwara ibe ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid gbuchara Golayat, ya na Jonatan bịara bụrụ ezigbo enyi. (1 Sam. 18:1) Onye nke ọ bụla nwere àgwà ndị masịrị ibe ya mere ka ha bụrụ enyi. N’ihi ya, tupu mmadụ na ibe ya abụrụ ezigbo enyi, ha ga-amarịrị onwe ha nke ọma. Ịmatakwanụ mmadụ nke ọma adịghị mfe. Ma a bịa n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, mmadụ nwere ike imeta onye ọzọ enyi naanị ma ọ pịa aka otu ebe n’Ịntanet. Ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ịhazi ihe ha ga-ekwu nke ọma n’Ịntanet otú ọ ga-amasị ndị ọzọ. Ha na-ekwukwa ihe ndị ga-eme ka a na-ele ha anya ọma. Ihe ndị a na-eme ka ọ dịrị ha mfe izochi ụdị ndị ha bụ n’eziokwu. N’ihi ya, ọ dị mma ka mmadụ kpebie ụdị ndị ọ ga-emeta enyi n’Ịntanet. Onye ị na-amaghị zitere gị ozi ka gị na ya bụrụ enyi, ụjọ atụla gị ịsị ya mba ma ọ bụ ịgba ya nkịtị. A sịkwala na ị chọghị ime ihe ga-ewute ya. Ụfọdụ ndị ekpebiela na ha agaghị na-aga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet n’ihi nsogbu ndị o nwere ike ịkpata. Ma, i kpebie ịga n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, olee ihe ndị i kwesịrị iburu n’uche?
LEENỤ VIDIO BỤ́ KPACHARA ANYA N’EBE A NA-EMETA NDỊ ENYI N’ỊNTANET, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu gị edenye ihe ma ọ bụ tinye foto n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?
-
Gịnị mere o ji dị mkpa ịkpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ndị gị na ha ga-abụ enyi n’Ịntanet?
-
Gịnị mere o ji dị mma inwe oge i kpebiri ị ga na-anọru n’ebe a na-emeta ndị enyi n’Ịntanet?—Efe. 5:15, 16