Ịtọrọ Mmadụ—È Nwere Ihe Ngwọta Ya?
Ịtọrọ Mmadụ—È Nwere Ihe Ngwọta Ya?
“ỊTỌRỌ mmadụ eruwo n’ókè nke mba a dum na-apụghị ịnagide ya, mmadụ nile aghaghịkwa ịlụso ajọ ihe a ọgụ,” ka praịm minista Chechnya kwuru mgbe ọ na-ekwe nkwa na ya ga-ekpochapụ ihe otiti ahụ dakwasịrị mba ya bụ́ Russia nke jupụtara n’ịtọrọ mmadụ.
Ikpochapụ ịtọrọ mmadụ? Nzube ya dị mma, ma ajụjụ bụ, N’ụzọ dị aṅaa?
Mgbalị Ndị A Na-eme
Gọọmenti Colombia ahọpụtawo ndị ọrụ nzuzo dị 2,000, ndị ọkàiwu 24, na ọbụna onye nduzi pụrụ iche ọrụ ya bụ nanị ịhụ na a tọrọghị mmadụ. Na Rio de Janeiro, Brazil, ngagharị iwe ọha na eze mere n’ihi ọtụtụ mmadụ a na- atọrọ n’obodo ukwu ahụ dọtara ihe dị ka 100,000 mmadụ. Na Brazil nakwa na Colombia, ìgwè ndị na-arụ ọrụ agha emegwarawo
ihe site n’ịtọrọ ndị ikwu nke ndị ntọ. Ụfọdụ ndị Philippines amalitewokwa iche nche—ha egbuwokwa ndị ntọ!Gọọmenti Guatemala amalitewo ịma ndị ntọ ikpe ọnwụ, president ha akwadebewo ndị agha ịkwụsị ntiwapụ nke ịtọrọ mmadụ. N’Itali gọọmenti emewo ihe ụfọdụ ndị sirị ike iji gbochie ịtọrọ mmadụ, site n’ịmachibido inye ihe mgbapụta iwu na ijichi ego na ihe onwunwe nke ndị ikwu nke onye a tọọrọ iji gbochie ha ịkwụ ihe mgbapụta. Gọọmenti Itali na-etu ọnụ na ihe ndị a esorowo mee ka ịtọrọ mmadụ belata. Otú ọ dị, ndị nkatọ na-ekwu na n’ihi ya, ọtụtụ ezinụlọ na-anwa inye ihe mgbapụta na nzuzo nakwa na nke a na-ebelata ọnụ ọgụgụ mmadụ gọọmenti maara na a tọọrọ. Ndị ọkà n’ihe banyere iche nche bụ́ ndị na-arụrụ onwe ha ọrụ, na-eme atụmatụ na ọnụ ọgụgụ ndị a tọọrọ n’Itali amụbawo okpukpu abụọ n’ezie kemgbe afọ ndị 1980.
Ọtụtụ Aro—Ihe Ngwọta Ole na Ole
Nye ọtụtụ ezinụlọ ndị a tọọrọ onye ikwu ha, ọ bụ nanị otu ihe ngwọta yiri ka ọ̀ dị irè—ịgbapụta ndị ha hụrụ n’anya ngwa ngwa o kwere mee. Ma ndị ọkachamara na-adọ aka ná ntị na ọ bụrụ na ihe mgbapụta ahụ buru ibu nakwa na a kwụọ ya ngwa ngwa, ndị ntọ ahụ pụrụ ile ezinụlọ ahụ anya dị ka nke dị mfe nnweta ma lọghachi nke ugboro abụọ. Ma ọ bụ ha pụrụ ikwu ka e nye ha ihe mgbapụta ọzọ tupu ha atọhapụ onye ha tọọrọ.
Ezinụlọ ụfọdụ enyewo ihe mgbapụta buru ibu ma mesịa chọpụta na onye ahụ a tọọrọ anwụworị. N’ihi ya ndị ọkachamara na-ekwu na e kwesịtụghị inye ihe mgbapụta ma ọ bụ kwuo okwu ya tupu e nweta ihe àmà na onye ahụ a tọọrọ dị ndụ. Ihe àmà dị otú ahụ pụrụ ịbụ n’ịjụ ajụjụ nke nanị onye ahụ a tọọrọ ga-enwe ike ịza. Ezinụlọ ụfọdụ na-ekwu ka e nye ha foto nke onye ahụ a tọọrọ nke o ji akwụkwọ akụkọ kasị ọhụrụ see.
Gịnị banyere ịnapụta mmadụ? Ọ na-enwekarị ihe ize ndụ dị ukwuu. “A na-egbu pasent 79 nke ndị nile e jichiri mgbe a na-anwa ịnapụta ha na Latin America,” ka Brian Jenkins, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịtọrọ mmadụ na-ekwu. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ mbọ ndị a na-agba iji napụta mmadụ na-aga nke ọma.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ihe ngwọta na-elekwasị anya n’igbochi ịtọrọ mmadụ. Ọ bụghị nanị gọọmenti na-anwa igbochi ịtọrọ mmadụ. Akwụkwọ akụkọ dị iche iche na-akụziri ndị mmadụ ụzọ isi zere ịbụ ndị a tọọrọ, ụzọ isi mapụ n’ụgbọala na-aga aga, na ụzọ isi ghọgbuo ndị ntọ. Ebe ndị a na-amụ ịlụ ọgụ aka na ụkwụ na-akụzi ụzọ isi lụso onye na-atọrọ mmadụ ọgụ. Ụlọ ọrụ dị iche iche na-ere obere ígwè nzipụ ozi ọnụ ego ya bụ $15,000, bụ́ nke a pụrụ itinye n’ezé ụmụaka iji nyere ndị uwe ojii aka ịchọta ụmụaka ahụ ma ọ bụrụ na a tọrọ ha. Nye ndị ga-azụtali ha, ndị na-emepụta ụgbọala na-emepụta ụgbọala ndị “na-egbochi ịtọrọ mmadụ” bụ́ ndị nwere ọnụ ebe e si agbapụ tear-gas, ebe e si agbapụ mgbọ, windo ndị mgbọ na-apụghị ịtụpu, taya ndị a na-apụghị igbuwa egbuwa, na ihe na-agbapụ mmanụ.
Ndị aka ji akụ̀ ụfọdụ na-ewere ndị na-eche ha nche dị ka ihe ngwọta ya. Otú ọ dị, n’ihe banyere ọnọdụ ahụ na Mexico, ọkachamara n’ihe banyere iche nche bụ́ Francisco Gomez Lerma na-ekwu, sị: ‘Ndị na-eche mmadụ nche agaghị enye aka n’ihi na ha na-adọta uche ndị mmadụ, nweekwa ike isoro ndị ntọ jikọọ aka.’
Nsogbu ịtọrọ mmadụ na-agbagwoju nnọọ anya, ọ gbanyesikwara mkpọrọgwụ ike nke na ọ dịghị ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ime yiri ihe ga-ekpochapụli ya. Ọ̀ bụzi na e nweghị ezi ihe ngwọta ya?
Ihe Ngwọta Ya Dị
Magazin a arụtụwo aka ọtụtụ ugboro n’ebe nanị otu ezi ihe ngwọta nke nsogbu nile dị otú ahụ na-eche ụmụ mmadụ ihu dị. Ihe ngwọta ahụ bụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru mgbe ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.
O doro anya na anyị chọrọ ọchịchị ezi omume n’elu ụwa nke ga-achịkwa ụdị mmadụ dịgasị nnọọ iche nke ụwa—ee, Alaeze Chineke nke Jisọs kwuru okwu banyere ya. Ebe ọ bụ na Abụ Ọma 83:18.
ụmụ mmadụ enwebeghị ike iguzobe ọchịchị dị otú ahụ, ọ ga-abụrụ anyị ihe amamihe ịtụkwasị obi n’Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. Okwu ya, bụ́ Bible na-ekwu na o zubere ime ihe a.—Daniel onye amụma dekọrọ nzube Jehova, na-ede, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Bible na-akọwa otú ọchịchị Chineke a ga-esi jiri nwayọọ nwayọọ kpochapụ mpụ nile, gụnyere ịtọrọ mmadụ.
Mmụta Kwesịrị Ekwesị Dị Oké Mkpa
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekweta na ịkụnye ụkpụrụ omume dị mma n’ime ndị mmadụ dị oké mkpa iji gwọta nsogbu ịtọrọ mmadụ. Tụlee, dị ka ihe atụ, otú ndụmọdụ Bible na-esonụ gaara esi metụta ụmụ mmadụ ma ọ bụrụ na ha nile na-erubere ya isi: “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a.” (Ndị Hibru 13:5) “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ́ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya.”—Ndị Rom 13:8.
Ị pụrụ ịmatatụ otú ndụ ga-adị site n’inyocha usoro izi ihe nke Ndịàmà Jehova na-eduzi n’ihe karịrị ala 230 n’ụwa nile. Usoro ihe omume a enwewo mmetụta dị mma n’ahụ ọtụtụ ndị nweburu anyaukwu ma ọ bụ bụbu ajọ ndị omempụ. Otu onye na-atọrọbu mmadụ kwuru, sị: “Ka oge na-aga, achọpụtara m na ka m wee mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, aghaghị m iyipụ mmadụ ochie m ma yiri nke ọhụrụ—nke dị umeala n’obi ma yie nke Kraịst Jisọs.”
Ma, ọbụna usoro izi ihe dị mma agaghị agbanwe ndị omempụ nile, ikekwe ọ gaghịdị agbanwe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha. Gịnị ga-eme ndị jụrụ ịgbanwe?
Iwepụ Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ
A gaghị ekwe ka ndị na-akpachara anya eme ihe ọjọọ bụrụ ndị Alaeze Chineke ga-achị. Bible na-ekwu, sị: “Ọ̀ bụ unu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị anyaukwu, . . . ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) “N’ihi na ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, . . . Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa.”—Ilu 2:21, 22.
Dị ka Iwu Chineke n’oge ochie si kwuo, a ga-egbu onye ntọ na-enweghị nchegharị. (Deuterọnọmi 24:7) Ndị anyaukwu, dị ka ndị ntọ, agaghị enwe ọnọdụ n’Alaeze Chineke. Ndị omempụ nke taa pụrụ ịgbanarị ikpe ziri ezi nke mmadụ, ma ha agaghị enwe ike ịgbanarị ikpe ziri ezi nke Chineke. Ndị ọ bụla na-eme ihe ọjọọ aghaghị ịgbanwe ụzọ ha ma ọ bụrụ na ha ga-ebi n’okpuru ọchịchị Alaeze ezi omume nke Jehova.
N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na ọnọdụ na-akwalite mpụ adịgide, mpụ ga-adịgidekwa. Ma, Alaeze Chineke agaghị ekwe ka nke ahụ mee, n’ihi na Bible na-ekwe nkwa, sị: ‘Alaeze ahụ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa,’ nke gụnyere ndị nile na-eme ihe ọjọọ. Amụma Bible gara n’ihu ikwu na Alaeze Chineke ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi. (Daniel 2:44) Cheedị mgbanwe ndị ga-ewere ọnọdụ!
Ụwa Ọhụrụ nke Ezi Omume
Tụlee amụma ọzọ nke Bible. Ọ bụ nke kọwara ọdịnihu n’ụzọ dị mma site n’okwu ndị a: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Alaeze Chineke ga-agbanwe mbara ụwa dum. Mmadụ nile dị ndụ ga-enwe ike ịnụ ụtọ ndụ n’uju ya, na-azụlite ikike ebumpụta ụwa ha site n’ịrụ ọrụ na-eju afọ na inwe ntụrụndụ dị mma. Ọnọdụ ga-adị n’ụwa nile ga-abụ nke na ọ dịghị onye ga-echetụdị echiche ịtọrọ onye agbata obi ya. A ga-enwe ịnọ ná nchebe zuru ezu. (Maịka 4:4) N’ihi ya, Alaeze Chineke ga-agbanweworị ịtọrọ mmadụ site n’ịbụ ihe iyi egwu zuru ụwa ọnụ taa gaa n’ịbụ ihe dị n’akụkọ ihe mere eme nke ọ na-adịtụghị onye ga-eche echiche banyere ya ọzọ.—Aịsaịa 65:17.
[Foto dị na peeji nke 20]
“Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4