Ịtọrọ Mmadụ—Isi Ihe Ndị Na-akpata Ya
Ịtọrọ Mmadụ—Isi Ihe Ndị Na-akpata Ya
ỊTỌRỌ mmadụ aghọwo ihe otiti nke oge a. Otú ahụ ka ọ dịkwa igbu ọchụ, ndina n’ike, ohi, mmetọ ụmụaka, na ọbụna mgbukpọ nke agbụrụ. N’ihi gịnị ka ndụ jizi dị nnọọ ize ndụ nke na ndị mmadụ na-atụkarị egwu isi n’ebe obibi ha pụọ n’abalị?
Isi ihe ndị kpatara ntiwapụ a nke ime mpụ, gụnyere ịtọrọ mmadụ, metụtara ntụpọ gbaworo mkpọrọgwụ nke ọha mmadụ. Ị̀ maara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, Bible buru amụma banyere oge ndị a dị ize ndụ? Biko tụlee ihe e buru n’amụma na 2 Timoti 3:2-5.
“Mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.”
Eleghị anya ị ga-ekweta na okwu ndị a e dekọrọ ogologo oge gara aga na-akọwa ọnọdụ dị taa nke ọma. N’oge ndụ anyị, ntụpọ ndị na-akawanye njọ nke ọha mmadụ na-agabiga ókè. N’ụzọ dị ịrịba ama, na Bible e ji okwu bụ́: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ,” malite nkọwa ahụ e nyere n’elu banyere àgwà ọjọọ nke ụmụ mmadụ. (2 Timoti 3:1, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ka anyị tụlee nanị atọ n’ime ntụpọ ndị bụ́ isi ọha mmadụ nwere bụ́ ndị so kpata ntiwapụ nke ịtọrọ mmadụ.
Nsogbu Ichebe Iwu
“N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 8:11.
Ọtụtụ ndị uwe ojii enweghị ihe ndị ga-enyere ha aka ịkwụsị ntiwapụ nke ime mpụ. N’ihi ya n’ọtụtụ mba, ịtọrọ mmadụ bụ mpụ na-eweta ego. Na 1996, ọ bụ nanị pasent 2 nke ndị Colombia nile na-atọrọ mmadụ ka e kpere ikpe. Na Mexico, ọ dịkarịa ala a kwụrụ nde $200 dị ka ego mgbapụta na 1997. Ọbụna ndị ntọ ụfọdụ na Philippines anarawo akwụkwọ ndọrọ ego maka ihe mgbapụta.
Ọzọkwa, nrụrụ aka nke ndị na-ahụ na e debere iwu na-egbochi ọgụ dị irè a na-alụso mpụ mgbe ụfọdụ. E bowo ndị isi nke òtù ndị siri ike na-alụso ịtọrọ mmadụ ọgụ na Mexico, Colombia, nakwa ná mba ndị dịbu
na Soviet Union ebubo ịtọrọ ndị mmadụ. Na magazin bụ́ Asiaweek, onyeisi Òtù Ndị Omeiwu nke Philippines, bụ́ Blas Ople, na-ekwu na ọnụ ọgụgụ gọọmenti nwetara na-egosi na aka ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị agha ka na-arụ ọrụ ma ọ bụ ndị laworo ezumike nká, dị na pasent 52 nke ntọrọ ndị e mere na Philippines. A sịrị na e gbochiri otu onye Mexico a ma ama n’ịtọrọ mmadụ ịnata ntaramahụhụ “site n’inye ndị isi uwe ojii na ndị ọkàiwu nke gọọmenti ime obodo, nke steeti na nke mba ahụ aka azụ, nke mere ka nchebe yiri mgbidi e nyere ya sikwuo ike.”Ịda Ogbenye na Ikpe Na-ezighị Ezi nke Ọha
“Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị.”—Eklisiastis 4:1.
Ọtụtụ ndị mmadụ taa enweghị ihe e ji ebi ndụ, ha adịghịkwa ahụ ezi mmekọrịta n’etiti ọha mmadụ, ọtụtụ mgbe ọ bụkwa ha na-atọrọ ndị mmadụ. Ya mere n’ụwa bụ́ ebe ọdịiche nke dị n’etiti ndị bara ọgaranya na ndị ogbenye nọgidere na-adịwanye ukwuu na ebe inweta ego n’ụzọ kwụ ọtọ na-esikarị ike, ịtọrọ mmadụ ga-anọgide na-abụ ọnwụnwa. Ọ bụrụhaala na mmegbu dị, ịtọrọ mmadụ ga-abụ ụzọ isi megwara na isi dọta uche n’ihe e weere na ọ bụ ọnọdụ a na-apụghị ịnagide.
Anyaukwu na Enweghị Ịhụnanya
“Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche.” (1 Timoti 6:10) “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” —Matiu 24:12.
N’akụkọ ihe mere eme nile, ịhụ ego n’anya emewo ka ndị mmadụ mee ajọ ihe dị iche iche. Ikekwe ọ dịghịkwa mpụ ọzọ na-akpatara ụmụ mmadụ nhụjuanya, iru újú, na obi nkoropụ ruo ókè ịtọrọ mmadụ na-eme. Nye ọtụtụ ndị, ọ bụ anyaukwu—ịhụ ego n’anya—na-amanye ha imekpọ onye ha jichiri ọnụ na ịta ya ahụhụ ma kpatara ezinụlọ ya ahụmahụ ọjọọ ruo ọtụtụ izu, ọnwa, na mgbe ụfọdụ afọ.
O doro anya na ọha mmadụ nke na-eji ego akpọrọ ihe ma na-eleghara ụkpụrụ omume anya nwere nsogbu. Obi abụọ adịghị ya na ọnọdụ a na-akwalite ụdị mpụ nile, gụnyere ịtọrọ mmadụ.
Ọ̀pụtara na anyị nọ n’oge Bible na-akpọ “mgbe ikpeazụ”? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ọ ga-apụtara ụwa na anyị? Ọ̀ dị ihe ngwọta dịịrị ajọ nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu, gụnyere ịtọrọ mmadụ?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]
Ọ Bụghị Ihe Ọhụrụ
Iwu Mosis mara ndị ntọ ikpe ogbugbu, laarị azụ na narị afọ nke 15 T.O.A. (Deuterọnọmi 24: 7) A tọọrọ Julius Caesar na narị afọ mbụ T.O. A., iji nata ihe mgbapụta, dịkwa ka a tọọrọ Richard nke Mbụ, bụ́ Obi Ọdụm, eze England, na narị afọ nke 12 O. A. Ihe mgbapụta kasị ukwuu e nyetụworo bụ tọn ọlaedo na ọlaọcha 24 ndị Inca nyere Francisco Pizarro bụ́ onye Spain meriri ha n’agha, iji tọhapụ eze ha e jidere n’agha bụ́ Atahuallpa na 1533. N’aghanyeghị nke ahụ, ndị ahụ meriri ha n’agha kwụgburu ya.
[Foto dị na peeji nke 19]
N’agbanyeghị ikike ndị uwe ojii nwere, ịtọrọ mmadụ ka zuru ebe nile